Ala mbuze mere na mba Mali atala isi mmadu kariri iri ano na ato
Written by admin on February 17, 2025
Opekatampe mmadụ iri anọ na atọ nke ọ ka n’ọnụ ọgụgụ ha ụmụ nwaanyị anwụnyuola anya piii n’oge e nwere ala mbuze n’ụbọchị Saturday n’otu ebe ana egwuputa akụ Chinyere dị n’ime ala na mba Mali.
Ya bụ ihe mere n’ala didobere obodo Kenieba nke mba Mali bụ ebe e kwuru na o jupụtara na ọla edo. Nkea sitere n’ọnụ Taoule Camara ji ọkwa odeakwụkwọ izugbe nke otu national union of gold counters and refineries.
Ụmụ nwaanyị ndị ahụ mmiri fara na eze ka e kwuru na ha banyere n’ime olulu ahụ eji igwe catapila were gwuo ịga lee ma ha ga-ahụ ụfọdụ ọla edo nke fọrọ afọ bụ oge olulu ahụ nọrọ dakwasị ha n’elu.
Ọnụ na e kwuru ministry n’ahụ maka igwuputa aku Chinyere dị n’ime ala kwukwara na ya bụ ozi ruru ha ntị na ọ bụ n’agbata obodo Kenieba yana Dabia ka ya bụ ihe mere mana o nweghị ka o siri kwuo mmadụ ole nwụrụ na ya ma ọ bụ ka o siri mee.
Udiri ihe ọdachi ka e kwuru na ọ na-adị eme kwa mgbe kwa mgbe na mba ahụ dịka ndị mmadụ anaghị agbasoro n’usoro kwesịrị were gwuo ala ịchọ akụ Chinyere nke gụnyere ọla edo amara dịka gold.