Ala mbuze mere n’obodo Kwa Zulu Natal nke dị na mba South Africa ataala isi mmadụ isii ebe ndị ọrụ enyemaka kana achọkwa ọtụtụ ndị ọzọ achọ na ya bụ ogige ihe mere.

Written by on February 21, 2025

Ala mbuze mere n’obodo Kwa Zulu Natal nke dị na mba South Africa ataala isi mmadụ isii ebe ndị ọrụ enyemaka kana achọkwa ọtụtụ ndị ọzọ achọ na ya bụ ogige ihe mere.

Ya bụ ihe ọdachi ka e kwuru na o sitere n’oke mmiri ozuzo malitere izo n’abalị ụbọchị Wednesday ma mecha fere n’ụtụtụ Thursday nke mechara butere ndị mpaghara ahụ ala mbuze bịara lie ọtụtụ ndị mmadụ na akụnụba ha na ndụ.

Otu Kwazulu Natal Cooperative governance and traditional affairs bụ ha kwupụtagoro ọnwụ mmadụ isii ahụ ahụgoro anya.

Ndị ahụ mmiri fara na eze gụnyere otu nwoke gbara afọ iri anọ na ise, obere nwata nwoke gbara afọ iri na atọ yana obere ụmụ agbọghọ abụọ gbara afọ iri na abụọ n’afọ iri na atọ n’otu n’otu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited