Anyi Di Nkwadobe Maka Ntule Aka Okpuruochichi Ime Obodo Na Enugu State – ENSIEC

Written by on September 20, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo olu Enugu State Independent Electoral Commission ENSIEC ekwela nkwa ezi usoro siriri werere nke nkwuba aka oto na ntule aka okpuruochichi ime obodo ga ewere onodu na State a echi bu Saturday, abali iri abuo na otu nke onwa September anyi nona ime ya.

Obu onye isi oche yabu ulo olu ENSIEC bu Prof Christian Ngwu kwere ngwa a na ndagharita nti onwere nyere ngalaba akuko uwa anyi ndi maka yabu ntule aka ochichi.

Prof Ngwu kowara n’ ulo olu ya emego nkwadobe etu osiri kwesi ekwesi ihuna ntule aka ochichi a gara nke oma n’ okpuruochichi ime obodo iri na asaa nakwa onumara Wards di nari abuo na iri isii enwere na State a.

Prof Ngwu kowara na’ aga anoro taata bu Friday zigacha akuru ngwa niile aga eji chikoba ntule aka ochichi a na isi obodo habu okpuruochichi ime obodo iri na asaa nke State a.

Yabu onye isi oche ulo olu ENSIEC gwara ngalaba akuko uwa anyi n’ enyego ezi ozuzu gaara ndi olu ulo olu ahu nakwa ndi olu nchere oge amara dika ad-hoc staff ga esonyere na yabu Local Govt Elections echi.

Okpokuru ndi tozugoro ogogo itu vote ma nwekwa akwukwo ikikere voter’s cards na State a ka ha nuputa na igwe echi bia sonyere na ntule aka ochichi a.

Ogara n’ iru gwa ngalaba akuko uwa anyi a n’ ulo olu ENSIEC n’ aluko olu nyere ndi nchekwa maka onodu siriri werere yabu ntule aka ochichi.

Prof Christian Ngwu kwuputara na ndenye na nnyocha maka ntule aka ochichi a akporo accreditation ga amalite na elekere asato nke ututu echi, ebe ipio akwukwo vote ga amalite na elekere iri nke yabu ututu, dika ntule aka ochichi a ga akuru onu na elekere ato nke ehihe.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies