Author: admin

Page: 4

Opekatampe mmadụ iri anọ na atọ nke ọ ka n’ọnụ ọgụgụ ha ụmụ nwaanyị anwụnyuola anya piii n’oge e nwere ala mbuze n’ụbọchị Saturday n’otu ebe ana egwuputa akụ Chinyere dị n’ime ala na mba Mali. Ya bụ ihe mere n’ala didobere obodo Kenieba nke mba Mali bụ ebe e kwuru na o jupụtara na […]

Ahụtala otu ndị agha M23 Rebels group na ama gọọmenti aka n’ihu na mba D R Congo ka ha yicha efe ndị agha were na agwa igwe mmadụ gbakọrọ n’obodo Katana okwu bụ obodo didobere ọdụ ụgbọelu Kavumu Airport nke mba DR Congo. Nkea na-abịa dịka otu M23 Rebels bụ ndị e kwuru na ọ […]

Gọọmenti mba South Africa ekwupụtala nwụchi nke ha nwụchiri Anabela Rungo bụ nne nke nwada ahụ tuburu ugo dịka nwaanyị kacha maa mma n’ala anyị akpọrọ Miss Universe Nigeria bụ Chidimma Adetshina. Ana ebo nne nwaanyị ahụ ebubo iji ụzọ aghụghọ nweta akwụkwọ ikike njirimara nwa afọ mba South Africa. Ha kwuru na ha nwetara […]

Aka chiburu Sokoto state bụ Aminu Waziri Tambuwal akọwala ndị ahụ si n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were na amịbanye n’otu party ọzọ na mpaghara North West dịka ndị na-achụ nta ihe afọ ha ga-eri n’enweghị echiche ọma ọbụla nyere otu PDP. Ndị nta akụkọ nwetara ozi n’ọtụtụ ndị nkwado otu PDP yana ogbo ha nke […]

Opekatampe mmadụ ise nwụnyuru anya piii n’oge ụgbọala opi ike bụ trailer nke bu akpa ntụ Cement hapụrụ okporo ụzọ ma gbaba n’otu ụlọ obibi dị na Nnewi nke Anambra Steeti n’ụbọchị Friday oge ana eme emume Valentine. Anya hụrụ ka ihe siri mee kwuru na ọ bụ n’akụkụ police area Command headquarters dị na […]

Mahamoud Ali Youssouf nke mba Djibouti eturula ugo dịka onyeisi oche otu African Union commission. Youssouf turu ya bụ ugo ụnyaahụ bụ Saturday ka e mechara ya bụ ntụliaka ugboro ise zuru oke dịka o meriri ogbo ya sitere na mba Kenya bụ Odinga Odinga n’agba nke anọ. Nwa amadi ahụ ga e weghara ọkwa […]

Otu onye nkụzi nke ụka Islam gbara afọ iri abụọ na itoolu bụ Abdulrahman Bello abụrụla onye aka ndị uwe ojii na Kwara State kpara ụnyaahụ bụ Saturday maka ebubo na o gburu enyi ya nwaanyị nọ n’afọ nke ikpeazụ ya na ụlọ akwụkwọ Kwara State College of education bụ Yetunde Lawal. Bello ka e […]

Aka ndị uwe ojii Anambra State Police Command akpatala otu nwoke e nyere aha ya dịka Christian Ndubuisi maka ebubo na o ji mma were magbuo nwanne ya nwoke nke tọrọ ya n’oge ha na-enwe esemokwu. Ya bụ njinji bụ nke cp Ikioye Orutugu ji ọkwa Commissioner ndị uwe ojii na state ahụ kọwara dịka […]

Onyeisi ala mba United States bụ Donald Trump ekwuola sị na ọ ga-amasị ya inwe mkparịta ụka ga-adị n’etiti yana ogbo na-achị mba Russia bụ President Vladimir Putin yana nke mba China bụ President Xi Jinping banyere etu ha ga-esi maputa iwu ga egbochi ịga n’ihu na ị rụpụta ngwa agha ọ gwụrụ mba akpọrọ […]

Mba Thailand azọpụtala Imirikiti ndị mmadụ atụrụ mgbere dị narị abụọ na iri isii nke ọkara n’ime ha bụ ụmụ afọ mba Ethiopia sitere n’obodo Myanmar. Nkea sitere n’ọnụ ndị agha mba Thailand bụ ndị kwuru na ha amalitela ime oke ala obodo ha ka ọ bụrụ agaga. Ịtụ mgbere mmadụ abụrụla ndị na ewu […]


Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited