Blog one column
Page: 5
Ndi oji egbe eri ana amaghi ndi ha bu anorola taata bu Monday wakpo ogige isi ulo olu ndi uwe oji Umunze Divisional Police Headquarters nke Orumba South LGA na Anambra State ma napu ndi uwe oji mmadu abuo ndu ha n’ ike. Odachi a n’ abia taata dika ogasiri naani izu uka abuo ndi […]
Nwa amadi ahu ji okwa Spiritual Director nyere ogige ekpere Adoration Ministry, Enugu, Nigeria bu Rev Fr Ejike Mbaka ekwuputala nkwado ya nyere onye ahu ji okoloto otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP azo okwa onye isi oche okpuruochichi Enugu East LGA na ntule aka ochichi Local Govt Elections n’ akpudobe nso na State a […]
Ndi uwe oji ala anyi na Imo State anapula ndi osochi egbu mmadu ato ndu ha n’ ike na State ahu bukwanu ndi ana ebo ebubo na ha choro iwakpo otu ogige isi ulo olu habu ndi uwe oji. N’ ozi onyefere ndi nta akuko n’ ogige Police Command Headquarters dina Owerri taata bu Monday […]
Anorola n’ agbata ngwucha izu uka anyi puru n’ ime ya unya bu Saturday nakwa mbido izu uka anyi banyere na ya taata bu uka mata mbe n’ abuo nke bu oke n’ ogogo asompi English Premier League EPL nke obodo England dina mba United Kingdom amakwuru dika mba Britain. Nke a bu dika otu […]
Aka n’ achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah agbapela ya n’ ozuzu oke ya bu olu ntiteghari ogige nkwu Enugu United Palm Products Ltd na State a. Gov Peter Mbah mere nke a unya bu Thursday oge owuchiri obodo Ibite-Olo dina Ezeagu LGA maka mmeme mgbape a dika osiri di na nkwekorita ego […]
Odachi ihe mgbawa nke ahu nwa bekee kporo Explosion emela na Abakaliki bu isi obodo Ebonyi State ma napu otu nwoke nakwa nwunye ya ndu ha n’ ike. Yabu ihe mgbawa mere na mpaghara Water Works Road nke isi obodo State ahu ka ozi kowara n’ obu nwoke enyere aha ya dika Mazi George nakwa […]
Oya Mpox nke amara na mbu dika Monkey Pox agala n’ iru n’ amubanye n’ obodo anyi a bu Nigeria dika ulo olu Nigeria Centre for Disease Control and Prevention NCDC noro taata bu Wednesday kwuputa mmadu iri isii na asaa oya ojo a kpatara aka ohuru n’ ala anyi. NCDC mere ka nke a […]
Otu nwaanyi gbara afo iri ise na ise enyedebere aha ya dika Ifeoma adala ma nwuo n’ ike n’ ebe ona enye akuko mgbama ihe oma Chukwu mere na ndu ya n’ ime ulo uka. Ifeoma k, ozi kowara n’ obuna ulo uka dina mpaghara Ejigbo Area nke Lagos State k’ ono n’ enye yabu […]
Onye General Overseer nke ogige ekpere Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry dina Onitsha nke Anambra State bu Pastor Chukwuemeka Ohanaemere amakariri dika Odumeje ma obukwanu Indaboski Bahose adola aka na nti dosia ya ike dogara ndi okowara na hana akato ya site n’ owa ozi social media. Na ozi onyonyo yabu Odumeje weputara […]
Ochichi Benue State etiela mkpu n’ oke olu kowa sina agwo n’ awakpozi mana akpa ike ojo n’ ogige ebe onodu ndi ahu gbara oso ize ndu ha na State ahu akporo Internally Displaced Persons IDP Camps enwere na mpaghara di ichiche nke yabu Benue State. Obu onye Executive Secretary ulo olu gbata gbata nke […]