Latest Updates

Page: 16

Aka na-achị Rivers steeti bụ Gov Siminalayi Fubara ekwuola na ụjọ ọbụla anaghị atụ ya n’ihe ọ ga-emecha were mụpụta bụ ọgba aghara okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na-ada na state ahụ ugbua. Gov Fubara kwuru nkea ụnyaahụ bụ Monday n’oge ọ gara igbape ụlọ obibi nke a rụrụ ndị ọrụ nke gọọmenti state ahụ na […]

Aka ndị uwe ojii na Enugu state akparala mmadụ asaa ana ebo ebubo ịgba izu ọjọọ yana iji egbe gaa ohi. Dịka akwụkwọ ozi sitere n’aka SP Daniel Ndukwe bụ ọnụ na e kwuru ndị uwe ojii na Enugu state sịrị kọwaa, ndị ana enyo enyo ka anwụchiri site na ngalaba ndị uwe ojii akpọrọ […]

Dịka akụkọ banyere akaọrụ nke ndị ntọri malitere mụbanyewa kwa ụbọchị n’ọhịa ndị enwegasiri n’obodo Irete yana obodo ndị gbara ya okirikiri nke council ime obodo Owerri West dina Imo State, ndị uwe ojii na state ahụ emela mkpocha na nzacha nke mere ka ha nwụchie mmadụ anọ ana enyo enyo n’aka ha dị na […]

Mba Israel amalitela ịkwụsị kpamkpam ọrụ enyemaka ọbụla na abanye n’obodo Gaza n’ihe ha kwuru sị na nkwekọrịta udo itinye mma n’obo nke hana otu isi ekwe ọnwụ Hamas nọrọ na mbụ kpaa abịala n’isi njedebe. Prime minister mba Israel bụ Benjamin Netanyahu bụ ya kwuru na otu Hamas jụrụ ịnabata mgbatị ụbọchị udo ahụ […]

Ụlọrụ n’ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ WHO ekwupụtala ọnwụ otu nwatakịrị gbara afọ anọ dịka onye nke abụọ nwụrụ na ọrịa Ebola bụ nke tasuru ọzọ na mba Uganda kemgbe ọnwa January n’afọ a. N’ụbọchị Tuesday nke izu gara aga ka ụlọrụ ahụike na mba Uganda kwuru na ha enwetala mkpesa banyere mmadụ […]

President Cyril Ramaphosa na-achị mba South Africa a goola ọfọ ọma n’isi ndị okpukperechi ụka Islam dịka ha malitegoro ọnwa ha ji eme ekpere na ebum ọnụ ha akpọrọ Ramadaan. Na ụwa niile nke ndị ụka alakuba na amalite na mgbe chi bọrọ buwa ọnụ ma na-emekwa ekpere so ya ruo mgbe chi ga eji […]

Nwa amadi ahụ so were lụọ ọgụ maka mnwere onwe mba Namibia bụ Sam Nujoma abụrụla onye adọnyere ozu ya n’ala n’ụbọchị Saturday nke ngwụcha izu ụka anyị pụrụ n’ime ya. Mmemme akwamozu ya bụ dọtara ndị gụnyere nwunye ya ọ hapụrụ laa mmụọ, ụmụ ya, ụmụ ụmụ ya tinyere ndị ọchịchị n’ala ndị isi […]

Onyeisi ala mbụ nke mba Namibia bụ Sam Nujoma azala oku chi ya kpọrọ ya ka ọ gbachara afọ iri itoolu na ise nne ya mụrụ ya. Ogbo ya na-achị mba ahụ ugbua bụ ya kwupụtara ọnwụ nke nwa amadi ahụ n’isi obodo ha bụ Windhoek. Nujoma bụrụ ya nọrọ n’isi ndị lụrụ ọgụ maka […]

Ogogo mmanu ala anyi a bu Nigeria na emeputa kwa ubochi ejirila per cent iteolu na uma iteolu gbago na onodu ka mma dika osiri di na nguko eweputara maka onwa November gara aga. Nke a bu kwere maka na ogogo barrel mmanu ala anyi kwa ubochi sitere na otu nde na uma ise, yabu […]

Ulo olu nnochite anya mba United States of America akporo US Embassy enyela ntuzi aka ohuru gaara umu afo Nigeria na acho ohere Visa isite ala anyi a gawa mba America na usoro ha ga agbasoro. Nke a bu dika osiri metuta ndi ahu nnwale ha maka yabu ohere Visa ga ewere onodu ma ogasia […]


Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited