Government Enugu state akagbuola mkpocha na nzacha nke onwa April.
Written by Onyinye on April 24, 2025
Govt Enugu State ekwuputala nkagbu mkpocha na nzacha kwa onwa akporo Monthly Environmental Sanitation nke onwa a bu April kwesiri iwere onodu na State a na ubochi Saturday bu abali iri abuo na isii.
Nke a putara ihe unya bu Tuesday site na ozi ode akwukwo govt State a bu Prof Chidiebere Onyia nyefere ndi nta akuko na ogige Lion’s Building nke obi govt State a dina isi obodo Enugu.
Na ozi a ka govt Enugu State mere ka amata na nkagbu yabu mkpocha na nzacha nke onwa a bu kwere maka ule ohere mbanye ulo akwukwo mahadum akporo Unified Tertiary Matriculation Examination UTME nke ulo olu Joint Admissions and Matriculation Board JAMB nke afo a bu 2025 ga amalite echi bu Thursday abali iri abuo na ano nke onwa a bu April na mpaghara niile nke ala anyi.
Prof Onyia sitere na ozi a kowa na nkagbu yabu mkpocha na nzacha bu ikeputara ndi sitere State a esonyere na yabu ule UTME ezi ohere ha ga eji lele ule ha ubochi Saturday na abianu na enweghi ihe mgbochi na udi obuna.
Na oge ona akowa na agaghi enwe mgbochi njem na udi obuna na State a yabu ubochi Saturday ka ode akwukwo govt Enugu State yoro ndi bina State a ka ha dosa gburugburu ha ocha.
Iga echetazi na ulo olu JAMB noro na ubochi Saturday gara aga mee ka amata na oyigharigo mmalite ule UTME nke afo a kwesiri imalite na ubochi Friday bu abali iri abuo na ise nke onwa a ka omalitezie echi bu Thursday, abali iri abuo na ano na ime onwa April.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.