GOVT ETITI AMALITGO ATUMATU MEGIDE ENWEGHI ONODU SIRIRI WERERE NA OLU NGO OKPORO UZO

Written by on December 11, 2024

Ulo olu ministry ogogo etiti ala anyi na ahu maka olu nakwa ulo olu nke ahu na ahu maka ngote akuru ngwa eji aru olu ohaneze amara dika Bureau of Public Procurement BPP amalitela amuma iji buo agha megide ihe mgbochi ndi ahu na adi na eme ka olu ngo na akpu na afo na ala ka ejula na obodo a bu Nigeria.

Nke a putara ihe na Abuja na mmalite mkpagharita ububo dina etiti minister ala anyi na ahu maka olu bu Sen David Umahi nakwa onye Director General yabu ulo olu BPP bu Dr Adebowale Adedokun.

Na yabu mkpagharita ububo were onodu na isi ulo olu Federal Ministry of Works dina Abuja unya bu Tuesday ka Sen Umahi nakwa Dr Adedokun noro lebasiara anya ike na usoro ka mma maka ngote akuru ngwa aga eji na eme ka olu ngo okporo uzo na aga siriri werere na ala anyi a.

Na ozi onye ndumodu puru iche na ihe metutara mgbasa ozi nyere yabu minister ogogo etiti bu Barr Orji Uchenna Orji nyefere ndi nta akuko ka Sen David Umahi nke jitopuru okwa Governor Ebonyi State noro kowa mkpa odi iweta ezi usoro mgbanwe ka mma nyere etu esiri egote akuru ngwa olu ngo okporo uzo na ala anyi.

Okporo oku njiko aka na olu maka atumatu a iji nwetazuo ihe umu afo Nigeria turu anya ya banyere ezi onodu okporo uzo ala anyi.

Na nke ya ka Dr Adebowale Adedokun toro ezi ukporo yabu minister weputagasiri maka onodu ka mma nyere olu okporo uzo na Nigeria.

Okwere nkwa sina ulo olu BPP ga adonyere Federal Ministry of Works ukwu maka atumatu ya niile dika osiri di na ukporo Renewed Hope Agenda nke ochichi President Bola Ahmed Tinubu jina aka.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies