Imirikiti ndị mmadụ karịrị otu puku agbakola n’isi obodo Ivory Coast bụ Abidjan na-akpọ ka etinye aha Tidjane Thiam n’akwụkwọ ndị ga-eso zọ ọkwa onyeisi ala obodo ahụ n’ọnwa October nke afọ a.
Written by Onyinye on June 16, 2025
Ọtụtụ ndị mmadụ karịrị otu puku agbakola n’obodo Abidjan bụ isi ọchịchị mba Ivory Coast na-eme ngagharị iwe ma na esi ọnwụ na aga agbakwunyeriri aha Tidjane Thiam n’akwụkwọ ndị ga-eso zọ ọkwa onyeisi ala obodo ahụ n’ọnwa October na-abịa abịa.
N’agbanyeghị oke mmiri ozuzo zoro na mba ahụ n’ụbọchị Saturday ka e kwuru na ndị ahụ jiri ụzọ udo were gbakọọ na ya bụ ebe didobere isi ụlọrụ Independent Electoral Commission bụ ụlọrụ n’ahụ maka ntụli aka ọchịchị na mba Ivory Coast.
N’abalị anọ nke ọnwa June ka ụlọrụ ahụ nọrọ wepụ aha Tidjane Thiam dịka onye ga eso zọ ọkwa nke onyeisi ala obodo ahụ ebe ụlọ ikpe nọ kwara na mbụ kwuo na nwoke ahụ etozughi ịzọ ya bụ ọkwa dịka ọ bụ nwa afọ mba Ivory Coast yana mba France otu ugboro.
Thiam bụ onye ṅụrụ iyi na ya ga ebusoriri nkabi ikpe ahụ agha ka a mụrụ na mba Ivory Coast mana o mechara bụrụ nwa afọ mba France n’afọ 1987 mana ọ nyeghachiri ha ya azụ n’ọnwa March nke afọ a.
Ndị ahụ na-eme ngagharị iwe ka ahụrụ ka ha yi akwa ọcha yana nke na-acha akwụkwọ ndụ nke gosiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị Thiam so ná ya ma na asụ ngọngọ na nke ahụ agaghị eme eme.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.