JOHN DUMELO NA EME IHE NKIRI ONYONYO FILM ETURUGO UGO NA NTULE AKA OCHICHI MBA GHANA

Written by on December 9, 2024

Nwa afo mba Ghana ahu ama ama na imeputa ihe nkiri onyonyo film bu mazi John Dumelo eturula ugo dika onye omebe iwu aroputara ohuru na ntule aka ochichi izugbe General Elections were onodu nwanne unya bu Saturday na mba ahu.

John Dumelo nwetara yabu mmeri dika onye omebe iwu ga anochite ogbonta vote Ayawaso West amakwuru dika Wuogon Constituency na ulo nzuko omebe iwu mba Ghana.

Yabu nwa amadi ji okoloto otu ndorondoro na ama ochichi mba ahu aka na iru bu National Democratic Congress NDC turu ugo ma merie onye na anochite yabu ogbonta vote ma burukwa onye ji okoloto otu ndorondoro New Patriotic Party NPP nona isi ugbo ochichi mba Ghana zogharia okwa bu Hon Lydia Alhassan.

Ozi kowara na obu kemgbe afo 2018 ka John Dumelo malitere inwe mmasi na yabu okwa ochichi mana emechara noro na ntule aka ochichi nke were onodu na afo 2020 merie ya, dika osiri onwu puta nke a onwetaziri mmeri na ngwucha afo a bu 2024.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies