NAFDAC emebiela ọgwụ adigboroja furu nde kwuru nde naira n’ahia ọgbọ ọgwụ dị na Onitsha Anambra Steeti.

Written by on February 11, 2025

Ụlọrụ na-ebu agha e megide ọgwụ na ihe oriri adigboroja n’ala anyị akpọrọ National Agency for Food and Drug Administration Control NAFDAC n’aha nkenke anọrọla ụnyaahụ bụ Monday wuchie n’ahia ọgbọ ọgwụ dị na Onitsha Anambra Steeti ma mebisie ọtụtụ ọgwụ adigboroja na ya bụ ahịa.

Onye ji ọkwa coordinator nyere ụlọrụ nafdac na mpaghara South East bụ Dr Martin Iluyomade bụ onye duru ndị otu ya mee ya bụ njem gwara ndị nta akụkọ na ha gana eme nke ahụ oge niile.

Iluyomade kwuru na ha mere nke ahụ site na nnyocha ha malitere ime kemgbe banyere akụkọ ha nụrụ etu ọgwụ adigboroja yana nke mebigoro emebi si were na amụbanye kwa ụbọchị. O kwuru na ya bụ njem dabara na mbọ ha n’agba ịchekwaba ndụ na ahụike ụmụ afọ Nigeria.

Na nkọwa ya ka o mere ka amata na udiri ọrụ ahụ ha rụrụ n’aga n’ihu na ahịa ọgwụ niile e nwere na mpaghara South East.

Nwa amadi ahụ mechara gbarụọ ihu n’ihe o kwuru sị na ndị isi ahịa ọgbọ ọgwụ agharipula ụlọrụ nafdac dịka ihe ndị ha hụrụ n’oge ahụ tụrụ ha n’anya.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies