Ndi Obodo Amechi-Uno nke Enugu State eritela elele nlekota aru Ike n’ efu sitere n’ isi ulo olu ndi agha ala anyi.

Written by on June 7, 2025

Opekata mpe ya buru mmadu di nari ato na iri na asaa bu umu afor ime Amechi- Uno di na Enugu south LGA na Enugu State eritela elele na nlekota aru Ike n’ efu sitere n’ isi ulo olu ndi agha ala amara dika Defence Headquarters.

Enye m aka gunyere, nnyocha aru Ike nakwa nkuzi banyere nri oriri, nnyocha oria sugar nakwa obara ngbali elu n’ efu, nnyocha anya, inye ogwugwo nakwa ugogbe anya , nnyocha eze, ikesa ihe ngbochi anwu nta gara umu nwanyi muru nwa ohuru nakwa ndi di ime tinyekwara inye ha ogwu n’ efu n’ otutu ihe ndi ozo.

N’ oge ha n’ ebunye oche igwe abuo gara mmadu abuo ndi Obodo ahu nwere nkwaru, ka onye Chief of Defence Staff (CDS) bu Gen Christopher Musa noro mee ka amata na isi ulo ndi agha a bu Defence Headquarters ga aga n’ iru na mbo ha n’ agba n’ inyere ndi mmadu aka.

Yabu onye ji okwa CDS nke onye nochitere anya ya bu Director Civil Military Relations bu Air Marshal Olushola Akinboyewa mere ka amata na nlekota aru ike a so n’ atumatu ogbako ozuzu were abali abuo akporo A two day human security and Civil Military Cooperation (CIMIC) workshop were onodu n’ ogige ndi agha 82 Division Dina isi Obodo Enugu.

N’ okwu ya,ka Lt Col. Adeyemi Abolade bu onye acting Commander n’ ulo ogwu 82 Division medical services and hospital Enugu mere ka amata na oria akachasi choputa n’ aru ndi Obodo ahu bu nke akporo upper respiratory tract infection nakwa oria iba.

N’ ozi ekene ha,ka Eze odinala n’ elekota ime Obodo Amechi-Uno bu HRH Igwe Daniel Nnamani , otu nwanyi ritere erere iche igwe bu Odoziaku Chinelo Ogbodo, tinyekwara onye isi oche okpuru ochichi Enugu south LGA bu Chief Celeb Ani buru ukpa ekene gara Onye CDS Defence Headquarters nakwa ogige ndi agha 82 Division maka ikwalite onodu nchekwa nakwa aru ike gara ndi bi na mpaghara ahu. Chief Ani kowara n’ oka bukwa ihe dika otu onwa k’ odi ugbua ha biakwara nlekota aru Ike n’ otu ime Obodo dikwa na mpaghara ahu.

Yabu onye isi oche gakwara n’ iru nyefe ihe onyinye inye ekene gara Maj- Gen Oluyemi Olatoye,( GOC) nke ogige 82 Division nakwa force commander of operation nke ulo olu Udoka.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited