Ndị uweojii na Rivers State mere ka amata na aka ha akpatala otu nwoke ana enyo enyo na ọ apunari ndị mmadụ ụgbọala ha n’ike na State ahụ.

Written by on June 6, 2025

Ndị uweojii na Rivers State mere ka amata na aka ha akpatala otu nwoke enyere aha ya dị Felix Clark bu onye ana enyo enyo na ọ na apunari ndị mmadụ ụgbọala ha n’ike ụnya bu Wednesday na Abacha Road dị na GRA area na Port Harcourt bu isi obodo State ahụ.

Ndị uweojii ahụ kọwara na ndi ọrụ ha agbakwụnyere ndị ọrụ Anti-Cultism Unit nke Assistant Superintendent of Police bu Attah Alih nọ n’isi ya, nwuchiri nwa amadi ahụ n’ihe dịka ojiri ọkara gafee elekere iri nke ụtụtụ n’oge ọ na agbaghari igwe ya na mpaghara ahụ.

Ha gara n’iru mee ka amata na ha nwetara seven master keys n’aka ya nakwa ụgbọala Hyundai Sonata ezuru ezu nke akara Reg number ya bu EKY 531 GG, bukwanu nke emere mkpesa na ọ nọ nefu efu na bee ya.

Ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na State ahụ bu SP Iringe-Koko, mere ka nkea puta ihe nye ndị nta akụkọ ụnya bu Wednesday.

Iringe-Koko kọwara na oge ha na agba nwa amadi ahụ ajụjụ ọnụ, na o mere ka ha mata ebe ndị otu ya ndị ọzọ na arụgasị ọrụ na Delta, Edo nakwa Lagos States, dika ọ gara n’iru mee ka amata na nyocha ka na aga n’iru.

Commissioner ndị uweojii bu Olugbenga Adepoju, toro ndị uweojii ahụ etu ha si agba mbọ ịhụ na enwetara nchekwa zuru oke nye ndị mmadụ nakwa ihe ha nwere.

Ọ gara n’iru riọ ohaneze ka ha gba mbọ na enyere ndị uweojii aka, site n’inye ha ozi ga abara ha uru iji rụo ọrụ ha nke ọma.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited