Ngagharị kpụ ọkụ n’ọnụ atasuola na mba Slovakia bụ ndị na-ekwu na onye ji ọkwa prime minister obodo ga akwụsịriri ọrụ kworo ukwu ọ dọnyere mba Russia

Written by on February 10, 2025

Imirikiti ndị mmadụ kariri puku iri enuputala n’igwe n’okporo ụzọ niile enwere na mba Slovakia were na esi ọnwụ na prime minister ha bụ Robert Fico ga agbariri arukwaghim nọkwa ya maka ebubo ha boro sị na nwa amadi yana onyeisi ala mba Russia bụ nnu na mmanụ.

Ndị ahụ ka ahụrụ n’ụbọchị Friday ka ha na-eti mkpu na-asị resign resign nke pụtara kwụsị ma ọ bụ rituo nọkwa ọrụ gị. Ha jikwa ọtụtụ ederede placards nke sịrị mba Slovakia bụ ala Europe. Ha gbakọrọ n’otu ebe akpọrọ freedom square nke dina Bratislava bụ isi obodo mba Slovakia.

Ya bụ ngagharị iwe nke ha na-emewa kwa izu ọbụla bịara kawanye njọ ozugbo Prime minister Fico mechara njem ya gaa n’obodo Moscow ịga hụ President Vladimir Putin na-achị mba Russia bụ nke e kwuru na onye Prime minister ahụ so ná naanị mmadụ ole na ole menugoro udiri njem ahụ na mba Europe kemgbe mba Russia malitere busowa mba Ukraine agha.

Ngagharị a abụrụla nke kacha buo ibu kemgbe afọ 2018 e mechara nke yiri nkea bụ oge ahụ egburu otu onye nta akụkọ na mba ahụ bụkwa nke mechara mee ka gọọmenti ha dakpọọ n’oge ahụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies