Nwaanyị ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood bụ Ini Edo amalitela iru uju nke nna ya nwụrụ anwụ.
Written by admin on February 25, 2025
Onye ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood bụ Ini Edo ekwupụtala ọnwụ nke nna ya nwụrụ anwụ.
Na iru uju nke nwoke ahụ ka Ini Edo nọrọ na ọwa ozi Instagram ya na mgbede ụnyaahụ bụ Monday kọwaa nwoke ahụ lagoro mmụọ dịka ịhụnanya mbụ ya nwenugoro na ndụ ya niile.
O kwuru n’ihe banyere nna ahụ ga-adịgide n’obi ya rue mgbe ebighị ebi.
Ahụtakwara ọtụtụ ndị nkwado ya ka ha sitere n’ozi e dere ede kasịwa nwaanyị ahụ obi maka ọnwụ nke nna ya.