Ochichi Enugu State Adila Njikere Ichikobara Ndi Obere Azum Ahia Ogbako Trade Fair

Written by on September 22, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt Enugu State site n’ ulo olu Enugu State Small and Medium Enterprises and Digital Economy na njiko aka n’ olu nyere otu ahia Naija Brand Chic ekwuputala atumatu oji n’ aka ichikoba ogbako ngosiputa ngwa ahia akporo Trade Fair nyere ndi obere azum ahia na State a.

Nke a bu dika osiri di na mbo ochichi State a n’ agba ikwalite ndi obere azum ahia nke ahu amara dika Micro, Small and Medium Enterprises MSMEs.

Obu onye ndumodu puru iche nyere Gov Peter Ndubuisi Mbah n’ ihe metutara yabu ngalaba MSMEs nakwa usoro akuluba ogbara ohuru nke Digital Economy bu Mazi Arinze Chilo-Offiah mere ka nke a puta ihe n’ isi obodo Enugu n’ ogbako ochikobara ndi nta akuko.

Mazi Chilo-Offiah kowara otu ahia Naija Brand Chic yana govt State a n’ ejiko aka na yabu atumatu Trade Fair dika otu nkwalite azum ahia ndi obere n’ ogogo nke ukwuu.

Na nke ya ka onye choputara yabu otu ahia Naija Brand Chic bu Nelly Agbogu mere ka amata n’ ulo olu ya ji atumatu n’ aka ikwalite ndi ahia obuladi naani na Enugu State kama na mpaghara South East n’ izugbe gunyekwara mpaghara nile nke Nigeria nakwazi mba ofesi.

Na mbu na okwu ya ka nnukwute onye enyemaka nyere aka n’ achi State a n’ ihe metutara mgbasa ozi bu Mazi Dan Nwomeh kwere nkwa sina Gov Peter Mbah n’ akwado yabu atumatu, ebe oyoro ndi n’ esonyere na ya ka ha gba mbo huna orutere mpaghara niile nke State a.

Onye nta akuko anyi bu Esther Iwuchukwu wetara ozi na yabu ogbako ngosiputa ngwa ahia Trade Fair nyere ndi obere azum ahia buna abali abuo nakwa abali ato nke onwa November afo a bu 2024 ka oga ewere onodu na State a.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies