OCHICHI ENUGU STATE AGBAPELA OLU NTITEGHARI OGIGE NKWU STATE A DINA EZEAGU

Written by on September 13, 2024

Aka n’ achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah agbapela ya n’ ozuzu oke ya bu olu ntiteghari ogige nkwu Enugu United Palm Products Ltd na State a.

Gov Peter Mbah mere nke a unya bu Thursday oge owuchiri obodo Ibite-Olo dina Ezeagu LGA maka mmeme mgbape a dika osiri di na nkwekorita ego di otu nari ijeri Naira govt State a nakwa ulo olu Pragmatic Palms Ltd noro n’ onwa May nke afo a nwe banyere ititeghari yabu ogige nkwu.

N’ okwu ya ka yabu aka n’ achi Enugu State kenere ohaneze ndi State a maka itukwasa ya obi nyere ntiteghari yabu ogige Enugu United Palm Products Ltd.

Na nke ya ka onye Managing Director ulo olu Pragmatic Palms Ltd bu Prof George Nwangwu kwere nkwa ime ogige nkwu ahu ka oburu otu n’ ime okacha mma ya n’ obodo a bu Nigeria.

Ndi ozo kwuru okwu na mmeme a gunyere: Commissioner n’ ahu maka olu ugbo bu Patrick Uburu nakwa ogbo ya nke n’ ahu maka azum ahia, itinye ego n’ azum ahia gunyere ulo nruputa akuru bu Adaora Chukwu nakwazi ndi sitere yabu obodo Ibite-Olo dina Ezeagu LGA.

Onye nta akuko anyi bu Esther Iwuchukwu wetara ozi na Gov Mbah noro na mmeme a gbape mmalite olu ngo ebe obibi Staff Quarters nyere ndi olu yabu ogige nkwu.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies