Ochichi Etiti Ala Anyi Ekwela Nkwa Ezi Udo Mmekorita Nyere Obi Nzuko Nso Christ Na Uwa Niile
Written by admin on April 19, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Govt etiti ala anyi dina aka ochichi President Bola Ahmed Tinubu ekwunwuola mkpebi ya nyere ezi udo mmekorita Nigeria nakwa obi nso nzuko nso Catholic na uwa niile dina Vatican City dika osiri metuta onodu mmekorita okpukperechi, aruike, omenala, mmuta, njem ala nso, nke nleru anya nakwa ibu agha megide agha isi ekwe onwu.
Nke a putara ihe na ubochi Friday site na onu Minister ogo nta ala anyi na ahu maka mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu oge onabatara onye nnochite anya yabu Vatican City ma burukwa onye Apostolic Nuncio nyere ala anyi bu Archbishop Michael Crotty na ulo olu ya dina Abuja.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi na ubochi Saturday ka nnukwute onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Ezeh mere ka amata na Amb Odumegwu-Ojukwu gara na iru kpa ububo nyere yabu onye nnochite anya nzuko nso Catholic na ala anyi banyere obi nso uka Christ na uwa niile na udi Holy See iruko olu nyere mba Italy maka umu afo Nigeria tozuru oke inweta ikikere njem mba ofesi Visa maka ndi choro iga njem ala nso na yabu Vatican City.
Dr Ezeh kowara na Amb Odumegwu-Ojukwu gwara yabu onye nnochite anya obi nso Vatican nyere ala anyi otutu mbo atumatu Renewed Hope Agenda President Tinubu maka ikwalite ochichi onye kwuo uche ya ma nwoghaa akuluba obodo a na ogogo ka mma.
Yabu Minister gakwara na iru kowa ya dika nke na abughi eziokwu etu esiri akowa onodu nchekwa ala anyi na usoro mgbasa ozi ogogo mba uwa okachasi dika osiri metuta ebubo na obu naani ndi otu Christ ka ana akwafusi obara ha na Nigeria.
Na oge ona akowa na ochichi etiti ala anyi na ebusi agha ike emegide ajo onodu nchekwa, ka Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu kwuputara ukpo ekene govt etiti gaara mbo obi nzuko nso Catholic dina Vatican City na agba maka udo na uwa niile.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.