Olile Anya Ndi Arsenal Na Iko EPL Akpobiela Ukwu Dika Man City Kwara Ha Isi Na Aja
Written by admin on April 19, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu egwu ball Manchester City ejirila okpu goal abuo asatara otu gosi Arsenal ihe oku ji nti oke eme dika osiri metuta ogogo English Premier League EPL nke England.
Asompi a were onodu na uhuruchi taata bu uka na ama egwuregwu Etihad stadium nke Manchester City ka Arsenal noro maa afo na ala dika osiri metuta olile anya ya ibu iko “EPL Cup” nke ogogo season a na aga na iru.
Na nkeji iri na isii na agba nke mbu mmalite yabu asompi ka Rayan Cherki buru uzo nyetara Manchester City otu okpu, ebe Kai Havertz nke Arsenal mere ngwangwa na nkeji iri na asato saa yabu okpu goal nke na eji otu okpu otu okpu gbacha agba nke mbu.
Ka oruziri na agba nke abuo na nkeji iri isii na ise ka Erling Haaland nyetara okpu goal nke abuo Manchester City ji kwaara Arsenal nkwa onwu ma dula ha na okpu abuo asatara otu.
Ka asompi a biara na isi njedebe ka Arsenal ji onu ogugu akara point ato agafe Manchester City na oche EPL table site na iji akara iri asaa noro na ndi nke mbu ebe Manchester City ji akara iri isii na asaa esochi ha na ndi nke abuo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.