Onodu Mpiawa Azu Adala Na Ogogo Egwurewgwu English Premier League

Written by on September 22, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu egwu ball Manchester City anorola taata bu uka nabata ogbo ya nke Arsenal n’ ama egwuregwu ya, ebe ha kwakoritara ya nke ukwuu n’ ogogo English Premier League EPL ma jiri okpu goal abuo abuo gba onwe ha onye naba onye naba.

Brighton nakwa Nottingham Forest nokwara taata jirikwuo okpu abuo abuo gba onwe ha onye naba onye naba na yabu ogogo EPL.

Iga echetazi na Chelsea buru uzo noro unya bu Saturday wuchie na bee West Ham, ebe yabu Chelsea ji okpu goal ato ana enweghi nke asatara kwara West Ham nnukwute nkwa onwu.

Na yabu unya ka Aston Villa ji okpu ato asatara otu pia Wolves utali mmuo, ebe Fulham ji okpu goal ato asatara otu gosi Newcastle ihe oku ji nti oke eme, dika Southampton nakwa Ipswich Town ji otu okpu otu okpu gba onwe ha onye naba onye naba.

Tottenham ji okpu goal ato asatara otu gosi Brentford na nwoke na ibe ya raa buna onu, ebe Leicester City nakwa Everton gbara onwe ha otu okpu otu okpu.

Na yabu unya bu Saturday ka Liverpool ji okpu goal ato ana enweghi nke asatara sachapu otu egwu ball Bournemouth uchu n’ aru, ebe Crystal Palace nakwa Manchester United kwuru onwe ha udo site n’ onye naba onye naba n’ enweghi yaburugodu otu okpu goal otu egwu ball abuo ndi a satara.

Na ka agbachara nke taata ka ahutara na Manchester City ji akara point iri na ato noro na ndi nke mbu na EPL Table, ebe Liverpool nona ndi nke abuo site n’ akara iri na abuo, Aston Villa enweta ndi nke ato site na yabu otu akara iri na abuo, Arsenal abanye na ndi nke ano site n’ akara iri na otu dika Chelsea ji akara iri agba ndi nke ise.

Newcastle abanye na ndi nke isii site na yabu otu akara iri, Brighton nwetara onwe ya na ndi nke asaa, ebe Nottingham Forest nwetara ndi nke asato, Fulham n’ agba ndi nke iteolu, dika Tottenham n’ agba ndi nke iri, Manchester United adalaga na ndi nke iri na otu.

Ndi nke nona ogogo ikpeazu na yabu EPL table weburu; Southampton nona ndi nke iri na asato, Everton nona ndi nke iri na iteolu, ebe Wolves mechara buo class n’ isi site n’ igba ndi nke ikpeazu bu iri abuo.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies