ONWU IKE AWAKPOLA, NAPU NWAANYI NO OFUFE NSO N’ ULO UKA NDU YA N’ IKE NA LAGOS STATE

Written by on September 11, 2024

Otu nwaanyi gbara afo iri ise na ise enyedebere aha ya dika Ifeoma adala ma nwuo n’ ike n’ ebe ona enye akuko mgbama ihe oma Chukwu mere na ndu ya n’ ime ulo uka.

Ifeoma k, ozi kowara n’ obuna ulo uka dina mpaghara Ejigbo Area nke Lagos State k’ ono n’ enye yabu akuko mgbama ihe oma Chukwu mere na ndu ya nke ahu nwa bekee kporo Testimony oge odara n’ ike.

Nwaanyi a ka ozi kowara n’ obuna agbata oge oforo nkeji iri na abuo k’ okuo elekere iteolu nke ututu ubochi uka gara aga oge ofufe nso Sunday Service n’ aga n’ iru ka oputara inye yabu Testimony ositere na ya fere onwu.

N’ oge ndi nta akuko kpoturu ya taata bu Wednesday n’ ogige Police Command Headquarters dina Ikeja k’ onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Lagos State bu SP Benjamin Hundeyin mere k’ amata n’ odachi a bu eziokwu.

SP Hundeyin gwara ndi nta akuko n’ obu oge yabu nwaanyi rutere n’ iru alter ma malite abu otito oga eji nye akuko mgbama ihe oma Chukwu mere na ndu ya k’ odara na mberede.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Lagos State kowaziri na emere ngwangwa buga nwaanyi a ulo ogwu ebe anoro kwuputa ya dika onye larugoro ala mmuo.

SP Benjamin Hundeyin gwara ndi nta akuko na di nwaanyi a nakwa ndi ezinulo ya ebugala ozu ya Anambra State bu obodo ha maka elim ozu ya.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies