Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu amalitela ọrụ ngo nke nnukwute okporouzo na Ebonyi State.

Written by on April 18, 2025

Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu, amalitela ọrụ ngo nke nnukwute okporouzo di 465 kilometres na Ebonyi State.

Ozi kọwara na nnukwu okporo ụzọ ahụ ga-agafe Calabar, Ebonyi, Benue, Nasarawa nakwa Abuja.

Mmemme mmalite ọrụ ngo a were ọnọdụ na Mgbom Amurọ Primary School dị na Afikpo LGA na State ahụ.

Onye isi ala anyi nke ọbu aka na chi Ebonyi State bu Governor Francis Ogbonna Nwifuru nọchitere anya ya, nwụrụ iyi na ọ ga agba mbọ hụ na arụchara nnukwu okporouzo ahụ n’oge ekwesiri iruchaya, na agbakwụnye na ọ ga-abụrịrị nke dị ezigbo mma.

President Tinubu gara n’iru too ndị ọnụ n’eru n’okwu na mpaghara South-East kwere maka etu ha siri enye ọchịchị ya nkwado, ma rịọ ha ka ha ga n’iru na enyekwa ya nkwado ha.

N’okwu ya, Governor Francis Ogbonna Nwifuru, toro President Tinubu n’ebe ọdị ukwu maka ịba ruputa nnukwu okporouzo ahụ na mpaghara South-East, na agbakwụnye na atụmatụ Renewed Hope Agenda ọchịchị ya ji n’aka, amalitela igbasa na mpaghara nile na ala anyi.

N’okwu nke ya ka onye Minister of Works bu Senator David Umahi kọwara onye isi ala anyi dika President mmadụ nile.

N’okwu nke ya ka nwa amadi ahụ jibu ọkwa Senate President ma buru odeakwụkwọ government etiti bu Senator Pius Anyim, toro President Tinubu maka iwe n’ọrụ nakwa ọrụ ngo ọ na arụ na mpaghara South-East, ma nwụọ iyi ịnye ya nkwado na ntule aka ọchịchị ọzọ aga eme n’odi n’iru.

Onye enyemaka pụrụ iche nye President Tinubu na Community Engagement bu Barrister Chioma Nweze kwuru na President Bola Ahmed Tinubu na aruputa okporouzo na ala anyi gba gburugburu nakwa ijikọta ndị mmadụ ọnụ.

Dika otoro Governor Francis Nwifuru kwere maka iweputa ebe aga arụ yabu nnukwu okporouzo, na agbakwụnye na mpaghara South-East kwu President Tinubu n’azu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited