Aka na achi Enugu State emela njem mgbaru gara ezinụlọ Late Christian Chukwu.
Written by Onyinye on April 18, 2025
Aka na chi State a bu Governor Peter Ndubuisi Mbah nọrọ ụnya bu Wednesday mee njem mgbaru gara ezinụlọ former Nigerian international and coach bu Christian Chukwu, ma kwe ha nkwa na ọbughi nanị ha kwu n’ihe ọdachi a.
Governor Mbah bu onye mere njem gaa mba London maka ọ dị mma ụmụ afọ State a na a oge Christian Chukwu kwụrụ, dika okwere nkwa na aga akwanyere ugwu ikpeazụ kwesịrị ya.
Ọ kọwara nwa amadi ahụ bu onye nke eji Chairman wee mara dika onye tinyere uchu nife ala anyi a n’ebe ọgbasara egwuriegwu, ma kpọlite mmụọ ọtụtụ ụmụ ntorobịa, ọ gara n’iru kwuo na ụmụ afọ Enugu State bu ebe o sitere na akwa akwa ariri maka ọnwụ nwa amadi a.
N’oge ọ na agwa ndị nta akụkọ okwu dika ọ gara kenecha ezinụlọ nwa amadi ahụ, Governor Mbah kwuru na ọnwụ Christian Chukwu abụghị naanị ezinụlọ ya ka ometụtara na ọnwụ ahụ metụtara government nakwa ụmụ afọ State a.
Ọ gara n’iru mee ka amata na Chairman Christian Chukwu bu aha amama dika ọ nọchitere anya ọtụtụ ngalaba n’abia n’ihe egwuriegwu n’ụwa nile gba gburugburu.
Governor Mbah kpọkpuru Chukwu Okike Abiama ka onye mkpuru obi Christian Chukwu ebe ezumike ebebe ma nyekwa ezinụlọ ya obi ndidi ha ga eji diye ọnwụ nwa amadi ahụ.
Ndị so Governor Mbah bịa mgbaru ahụ bu Speaker, Enugu State House of Assembly, bu Hon. Uchenna Ugwu nakwa Commissioner for Youths and Sports Development bu Barrister Lloyd Ekweremadu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.