Onye nlekọta nke otu egwuregwu Rangers International football club nke Enugu state agwala ndị otu egwuregwu ya ka ha kee ajụ na ume ịhụ na mmeri bụ nke ha.

Written by on April 25, 2025

Onye nlekọta nke otu egwuregwu Rangers International football club nke Enugu state bụ Amobi Ezeaku agwala ndị otu egwuregwu ya ka ha kee ajụ na ume ịhụ na mmeri bụ nke ha n’oge ahụ ha ga ezute ogbo ha bụ Enyimba city nke Aba.

Enugu Rangers ga ezute Enyimba city na asọmpi nke iri atọ na ise ya na ama egwuregwu Nnamdi Azikiwe stadium dina Enugu n’ụbọchị ụka na abịa.

Ya bụ otu egwuregwu amakwara dịka flying antelope emeriela naanị otu ugboro n’ime asọmpi ise ha putagoro ihe na ya.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi na otu Enugu Rangers hana Enyimba City gbara onwe ha onye laba onye laba na mgbe mbụ ha zutere onwe ha n’ime oge anyị nọ n’ime ya na Aba nke dina Abịa State.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited