Onyeisi ala mba Ukraine bụ President Volodymyr Zelensky ekwuola si na ya dị njikere iritu nọkwa ọrụ ya dịka onyeisi ma ọ bụrụ na ọ bụ ya ga eme ka mba Ukraine sonyere n’otu ahụ akpọrọ North Atlantic Treaty Organisations NATO

Written by on February 24, 2025

Onyeisi ala mba Ukraine bụ President Volodymyr Zelensky ekwuola ya ka ọ daa gem na ntị onye ọbụla si na ya dị njikere iritu nọkwa ọrụ ya dịka onyeisi ma ọ bụrụ na ọ bụ ya ga eme ka mba Ukraine sonyere n’otu ahụ akpọrọ North Atlantic Treaty Organisations NATO n’aha mkpirisi.

O kwuru nkea n’oge ọgbakọ ndị nta akụkọ achịkobara na mba ahụ.

President Zelensky gbakwunyere na o nweghị mgbe o jiri bụrụ echiche ya ịnọgide n’ọchịchị ọkpụ tara ọkpụ kama na ya dị njikere ịhapụ ocheeze ya ma ọ bụrụ na ọ bụ ya ga eweta udo na mba Ukraine.

Okwu ndị a niile na-abịa dịka mba Russia nọchara zuo mgbọ egbe nke akpọrọ drones ka mmiri tupu ọ na-eme afọ atọ zuru oke agha ahụ malitere ịda.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies