Onyeisi ala mba United States bụ Donald Trump ekwuola sị na ọ ga-amasị ya inwe mkparịta ụka ga-adị n’etiti yana ogbo na-achị mba Russia bụ President Vladimir Putin yana nke mba China bụ President Xi Jinping banyere etu ha ga-esi maputa iwu ga egbochi ịga n’ihu na ị rụpụta ngwa agha ọ gwụrụ mba akpọrọ nuclear weapon.
Written by admin on February 14, 2025
Onyeisi ala mba United States bụ Donald Trump ekwuola sị na ọ ga-amasị ya inwe mkparịta ụka ga-adị n’etiti yana ogbo na-achị mba Russia bụ President Vladimir Putin yana nke mba China bụ President Xi Jinping banyere etu ha ga-esi maputa iwu ga egbochi ịga n’ihu na ị rụpụta ngwa agha ọ gwụrụ mba akpọrọ nuclear weapon.
Na ajụjụ ọnụ ndị nta akụkọ gbara Trump n’ụlọ ọrụ Oval Office ka o kwuru na amụma ahụ ka ọchịchị ya nke ugboro abụọ ga agbado ụkwụ.
Trump kwuru na ya malitere ịkpa ụbụbọ na mgbe mbụ ya bịara n’ọchịchị mana nje covid19 mechara bịa gbubiri amụma ahụ ka ọ ghara ị mita mkpụrụ. Ozi kwuru na ogige abụọ abụọ ngwa agha ọ gwụrụ mba ha kacha gbagote n’ụwa niile dị n’obodo Moscow nke mba Russia yana Washington nke mba United States.
Donald Trump ekwughị mgbe mkparịta ụka ahụ ga amalite mana o mere ka amata na ọ bụ n’oge na-adịghị anya.