Otu Ndorondoro APC Eweputala Ubochi Oga Achikoba Ntule Aka Ochichi Ime Ulo Maka Ndi Ga Eji Okoloto Ya Zoo Okwa Di Ichiche Na Ntule Aka Ochichi Izugbe Afo 2027
Written by admin on April 21, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu ndorondoro ochichi All Progressives Congress APC eweputala abali iri na ise nakwa iri na isii nke onwa ozo bu May dika ubochi ntule aka ochichi ime ulo akporo Party Primaries iruputa onye ga eji okoloto otu ndorondoro a zoo okwa onye isi ala na ntule aka ochichi izugbe afo 2027.
Nke a putara ihe unya bu Monday site na ozi ode akwukwo nhazi na okwa National Organizing Secretary otu ndorondoro APC na ogogo etiti ala anyi bu Suleiman Argungu nyefere ndi nta akuko na Abuja.
Na ozi a ka Argungu noro kowa na ntule aka ochichi ime ulo maka iroputa ndi ga eji okoloto APC zoo okwa na ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti House of Representatives ga ewere onodu na abali iri na asato nke onwa ozo, ebe nke ulo nzuko ukwu Senate ga abu na abali iri abuo na yabu onwa ozo.
Otu ndorondoro APC sitere na ozi a kowa na ntule aka ochichi ime ulo maka ndi ga eji okoloto ya zoo okwa na ulo nzuko omebe iwu State Houses of Assembly ga ewere onodu na abali iri abuo na otu nke onwa ozo, ebe ntule aka ochichi ime ulo a maka ndi ga eji okoloto yabu otu ndorondoro zoo okwa Governor ga abu na abali iri abuo na ato nke onwa ozo.
APC gara na iru site na ozi a Suleiman Argungu nyefere ndi nta akuko kowa na obu ego di otu nari nde Naira yabu; 1 Hundred Million ka aga eji gote akwukwo ikikere Expression of Interest and Nomination Forms maka ndi choro izo iji okoloto otu ndorondoro a zoo okwa onye isi ala, ebe nke ndi choro izo okwa Governor ga abuo nde Naira iri ise, dika nke ndi Senate ga abu nde Naira iri abuo, ebe nde Naira iri ga abuo maka House of Representatives, dika ndi choro izo maka ulo nzuko omebe iwu State Houses of Assembly ga abu nde Naira isii.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.