Otu Ndorondoro APGA Agbalara Ndi Nkwado Gov Soludo Ugbonwamkpi

Written by on September 26, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi nchikwa otu ndorondoro All Progressives Grand Alliance APGA n’ ogogo etiti ala anyi achupugodula n’ udi ahu nwa bekee kporo suspension bu ndi nkwado Gov Charles Chukwuma Soludo n’ achi Anambra State na yabu otu ndorondoro.

Nke a putara ihe taata bu Thursday site n’ onu onye isi oche izugbe otu ndorondoro APGA bu Chief Edozie Njoku n’ ogbako ochikobara ndi nta akuko na Abuja.

Chief Njoku kowara na nchipugodu ndi a na otu ndorondoro APGA bu kwere maka ebubo mgba okpuru ha megide otu ndorondoro a.

Okowara na nke a bukwu kwere maka ntule aka ime ulo nakwa ogbako megidere iwu okporo illegal primary elections and Congresses habu ndi nkwado Gov Charles Soludo gara chikoba na Anambra State.

Yabu onye APGA National Chairman kwuputara n’ aha habu ndi nkwado aka n’ achi Anambra State agbara ugbonwamkpi gunyere: Barr Sylvester Ezeonwuka, mazi Ifeatu Obi-Okoye, Dr Alex Obiogbolu nakwa ndi niile ahu aroputara na ntule aka ime ulo primary elections gunyere ogbako Congresses ha chikobara.

Chief Edozie Njoku doro aka na nti gaara Gov Charles Chukwuma Soludo nakwa ndi omebe iwu n’ ogogo etiti gunyere nke State aroputara site n’ okoloto otu ndorondoro APGA ka kwusi igbaso otu ndorondoro a mgba okpuru ma obukwanu ha adi njikere iche aka ghoro ntarama ahuhu dina ya.

Okowara na eguzobego otu Disciplinary Committee ga elebara anya na agwa ojo ndi a achupugoduru na otu ndorondoro ahu.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies