Otu nwa agbọghọ nọ n’afọ nke atọ na mahadum Nnamdi Azikwe University dị na Awka Anambra Steeti ka ozi kwuru na o jiri arụ chọọ ịtagbu otu onye nkụzi nke mahadum ahụ n’oge ha na-enwe esemokwu.
Written by admin on February 13, 2025
Otu ahu jikoro umuakwukwo ala anyi akporo National Association of Nigerian Students NANS akatola ya na ebe odi ukwuu bu ozi ahu na agaghari etu otu nwata akwukwo nwagbobia mahadum Nnamdi Azikiwe University amakariri dika UNIZIK dina Awka bu isi obodo Anambra State siri bie otu onye nkuzi mahadum ahu aka ojo na aru.
Otu NANS mere ka nkato ya megide ebubo agwa ojo nwagbobia mahadum ahu puta ihe taata bu Wednesday na ozi onyefere ndi nta akuko na Ibadan bu isi obodo Oyo State bu onye Senate President otu a jikoro umuakwukwo Nigeria bu Comrade Babatunde Akinteye.
Na ozi a ka otu NANS kwunworo mkpebi ya izo maka ikike diara nwata akwukwo obuna na ala anyi, kama na umuakwukwo gana agba mbo na aka nke ha na ebi ndu kwesiri ekwesi mana enwekwa nrube isi na ezi ukporo nakwa iwu na achikwa ulo akwukwo ha.
Otu a jikoro umuakwukwo ala anyi kpoziri oku nnyocha toro ato gaara yabu ebubo agwa ojo nwata akwukwo mahadum.
Ozi kowara na yabu nwagbobia nona ogogo afo nke ato ya na ngalaba Faculty of Arts na ulo akwukwo UNIZIK kusuru onye nkuzi mahadum ahu enyere aha ya dika Dr Michael Chukwudi kwere maka ebubo na yabu onye nkuzi butere ya ihe mkpobi ukwu na onyonyo ona emenye na owa ozi TikTok.
Ozi a mere ka amata na yabu nwagbobia ji eze takasia onye nkuzi ahu aru ma dokasia akwa ya.
Na aka nke ha ka ndi nchikwa yabu mahadum UNIZIK sitere na ozi onye isi ngalaba mgbasa ozi nakwa mmekorita ohaneze ha bu mazi Louis Njelita nyefere ndi nta akuko yoo ka ohaneze dere juu dika ha kwere nkwa nnyocha toro ato na yabu onodu.