Anambra State
Ndi otu Nigerian Union of Electricity Employees anorola tata bu Thursday me ngaghari iwe megide mnwuchi nakwa njichi ulo olu Enugu Electricity Distribution Company EEDC nwuchiri ndi otu ha mmadu ise. Yabu ngaghari iwe bu nke were onodu na ulo EEDC nile digasi na Awka, onitsha nakwa na mpaghara ndi ozo di na state ahu,ka […]
Ụlọ ọrụ Anambra State Board of Internal Revenue na njikọ aka ụlọ ọrụ State Anti-Touting Agency, anwuchiela ma kpọpu n’ụlọ ikpe ụfọdụ ndị ahụ na anakọta ego n’ụzọ iwu na akwadoghi dika mbọ ha na agba iji kpochapụ ndị omekome bu ndi na egosi onwe ha dika ndị na anara government ego na State ahụ. […]
Nwa amadi ahu so na ndi choputara otu ndorondoro people’s democratic party PDP bu Prof, Jerry Gana, emela ka amata na nwa amadi ahu jiburu okwa governor Anambra state bu Mazi Peter Obi ga emeriri onye obula sitere ngbago ugwu imasa ya aka,ma oburu na ojiri okoloto otu ndorondoro PDP zoo okwa ochichi. N’ okwu […]
Ulo olu Independent National Electoral Commission INEC agbatikwuola oge nyere ndebanye aha ndi ga atu akwukwo vote bu nke n’ aga n’ iru ugbua. Nkpebi a putara ihe n’ oge ha nwechara nzuko izu uka ha tata bu Thursday. Na yabu nzuko ka ha noro lebara anya na nkwadobe n’ aga n’ iru maka ntuliaka […]
Ndị otu World Igbo National Union WINU, otu ụmụ afọ Igbo na akwado udo, ọganihu nakwa mmepe nke ala Igbo, akatọla n’ebe ọdị ukwu okwu ahụ aka na achị Anambra State bu Governor Charles Chukwuma Soludo kwuru n’ọdị nso a na Maryland dị na mba United States of America, bu ebe oboro ebubu na 99.9% […]
Amalitela itu atumatu aga eji mee ka igba boi nyere umu Igbo buruzie afo asaa zuruoke na Anambra state. N’ otu aka ahukwa ka ana akowa na nwa afo Igbo obula nwere mmasi igba boi ga aguriri akwukwo n’ ogogo nke primary tupu ome nke a. Ihe ndi a nile putara ihe n’ atumatu iwu […]
Aka na achi Anambra State bu Governor Charles Chukwuma Soludo, agọnarila ebubo na ọ gara na nke onye dibia anya nzu gbasara nlaghachite n’ọkwa na ntule aka ọchịchị governorship election bu nke ga ewere ọnọdụ na abalị asatọ n’ọnwa November afọ a bu 2025. Ụfọdụ ozi nakwa ihe onyonyo na efeghari n’ụwa ozi bu nke […]
Aka ndị uweojii na Anambra State akpatala mmadụ atọ ana enyo enyo na ha so n’otu ndị oji egbe aga bu ndi aka ọrụ ha bu iji egbe punari ndị mmadụ ihe ha nwere n’ike ọkachasi ọgbọ ala. N’ozi putara ihe taata bu Monday site n’aka ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na State ahụ bu […]
Nwa amadi ahụ jibu ọkwa Governor na Anambra State bu Chief Willie Obiano, akagbuola akụkọ ahụ na efeghari n’ụwa ozi bu nke na akọ na ọ na akwado otu onye pụtara izo ọkwa Governor na ntule aka ọchịchị Anambra Governorship Election aga eme n’odi n’iru. Nkea sochiri dika ahụtara akụkọ na efeghari na uwa ozi […]
Ulo olu independent National Electoral Commission INEC emela ka amata na ha di njikere iweta ogbugbo nyere ihe ima aka ndi ahu ndi nwere nkwaru gabigara na ntuliaka ndi enweburu n’ afo ndi gara aga. Obu onye resident electoral commissioner n’ ahu maka Anambra state bu Dr Queen Elizabeth Agwu mere ka nkea puta ihe […]