ZEERE MPAGHARA ALA IGBO KA OTU IPOB NA AGWA NDI EKPERIMA MAKA MMEME CHRISTMAS, AFO OHURU

Written by on December 12, 2024

Otu ahu nona isi ugbo izo maka Biafra dika mba kwuru na onwe ya bu Indigenous People of Biafra IPOB adola aka na nti dosia ya ike dogara ndi ekperima ka ha zeere mpaghara South East obodo a ma obukwanu ha eche aka ghoro odachi sona agwa ekperima ha.

Otu IPOB gara na iru kwunwuo uchu ha di itinye oke maka mweghachite udo toro ato na mpaghara ala Igbo dika ha mere ka amata mkpebi ha ihuna enwere ezi gburugburu doro aru nyere umu afo Igbo na mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru ana abanye na ya.

Ihe ndi a putara ihe taata bu Thursday site na ozi onyefere ndi nta akuko na Nnewi dina Anambra State bu ode akwukwo mgbasa ozi nakwa ohaneze nyere otu IPOB bu mazi Emma Powerful.

Na ozi a ka otu IPOB kowara na ha ga enye aka na nchekwa ndu na akuluba ohaneze ndi Igbo na mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru ana abanye.

Otu a kpokuziri umu afo Igbo nona uzo ije ka ha natara onwe ha maka mmeme a na atughi ujo na udi obuna.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies