IKWUSI OGBAGHARA RUSSIA NAKWA UKRAINE BU IHE IZIZI MU GA EME DIKA ONYE ISI ALA AMERICA KA DONALD TRUMP NA EKWU
Written by admin on December 11, 2024
Nwa amadi ahu aroputaghariri ohuru na okwa onye isi ala mba United States of America bu Donald Trump emela ka amata na oga eji ihe banyere ogbaghara mba Russia nakwa Ukraine mere olu kachasi ya mkpa ngwangwa obanyere na ochichi.
Donald Trump mere ka nke a puta ihe taata bu Wednesday na okwu ogwara ndi nta akuko.
Yabu nwa amadi kowara ogbaghara a dika nke na eko achicha ma burukwa nke tagoro isi otutu ndi mmadu nyere mba abuo ahu.
Okowara mkpa odi ime ngwangwa cho ogbugbo nyere nkwafu obara ahu malitere kemgbe onwa February afo 2022 na etiti Russia nakwa Ukraine.
Donald Trump noro oge ona akowa na ogbaghara nke na adagasi na mpaghara Middle East na echukwu ura kwuputa na nke ahu dina etiti mba Russia nakwa Ukraine kacha ukwu nke ntopu ogodo na ukwu.
Iga echetazi na obuna abali iri abuo nke onwa ozo bu January afo 2025 ka Donald Trump ga eweghara okwa ochichi onye isi ala mba America site na aka President Joe Biden ji yabu okwa ka odi ugbu a.