Ogbaghara ahu na ada na otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP na ogogo etiti ala anyi agala na iru na agbanwe ukwu egwu ya na ajo onodu amaghi ihe echi ga abu nyere yabu otu ndorondoro

Written by on February 13, 2025

Ogbaghara ahu na ada na otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP na ogogo etiti ala anyi agala na iru na agbanwe ukwu egwu ya na ajo onodu amaghi ihe echi ga abu nyere yabu otu ndorondoro kachasi ukwuu na ndi na amasa otu ndorondoro nona isi ugbo ochichi etiti aka na iru.

Nke a bu dika yabu otu ndorondoro, mpaghara ya nke Abia State noro unya bu Tuesday kwuputa nchitugodu na okwa amara dika Suspension gaara nwa afo State ahu ji okwa onye isi oche otu ntukwasa obi nke PDP Board of Trustees na ala anyi ma burukwa onye jiburu okwa Senate President bu Sen Adolphus Wabara.

Otu ndorondoro PDP na Abia State kowara na Sen Wabara na agbaso mgba okpuru megide odimma otu ndorondoro a.

Yabu alaka PDP na Abia State boro ebubo sina nwa amadi a sitere na okwu onu ya akwado ochichi Gov Alex Otti nke otu ndorondoro Labour Party okachasi dika osiri metuta iga ochichi nke ugboro abuo na afo 2027.

Ka osiladi, ndi nchikwa otu ndorondoro a na ogogo etiti ala anyi amara dika PDP National Working Committee nke obu Amb Umaru Damagum nona isi ya emela ngwangwa kwuputa mkposa yabu nchitugodu na okwa onye isi oche otu Board of Trustees.

Nke a putara ihe taata bu Wednesday na ozi ode akwukwo mgbasa ozi na okwa PDP National Publicity Secretary na ala anyi bu Mazi Debo Ologunagba nyefere ndi nta akuko na Abuja.

Na ozi a ka PDP National Working Committee noro kowa atumatu ndi nchikwa otu ndorondoro a na Abia State megide Sen Adolphus Wabara dika nke nagoro na iyi.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies