Gọọmenti Abịa state amalitela idebanye aha ụmụ afọ ha maka ị nweta akara nke ha kpọrọ Social identification number.

Written by on February 25, 2025

Ọchịchị Abia State site na ụlọrụ ministry of budget and planning emela ka ọhaneze mata na ha amalitela ndebanye aha ụmụ afọ state ahụ yana ndị bi ebi na Abịa State.

Dịka gọọmenti state ahụ sịrị kọwaa, ndị debanyere aha ha ka aga enye akwụkwọ ikikere nke nwere akara Abia State Social Identification Number.

Site na ya bụ akwụkwọ ikike ka gọọmenti ga-esi na ahazi akụnụba nke state n’ụzọ ka mma nke gụnyere ị wetara ụmụ afọ state ahụ ezi obibi ndụ.

Commissioner n’ahụ maka nhazi usoro ọrụ na Abịa State bụ Kingsley Anosike kwupụtara nkea ụnyaahụ bụ Monday site n’otu akwụkwọ ozi nke gọọmenti wepụtara ọhaneze. O kwuru na ya bụ mpempe akwụkwọ ka aga eji na amata kpọmkwem nwa afọ Abia State tinyere ọtụtụ elele ndị ọzọ aga esi na ya nweta nke gụnyere enyemaka ahụike nakwa ohere ịgụ akwụkwọ n’efu.

Ihe ndị ọzọ onye Commissioner ahụ gbakwunyere bụ o bụ n’efu ka ana edebanye ya bụ aha. Ebe ohere ahụ dịrị nwa afọ Abia State ọbụla malite na mgbe a mụrụ onye ruo ndị megoro agadi.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited