Akpokuola ndi otu Christ na uwa niile ka ha gbasoro usoro ndi ahu kwesiri ekwesi cho iru Chukwu Okike Abiama

Written by on February 25, 2025

Akpokuola ndi otu Christ na uwa niile ka ha gbasoro usoro ndi ahu kwesiri ekwesi cho iru Chukwu Okike Abiama maka ezi onodu ha na uwa a nakwa nketa oke alaeze yabu Chukwu.

Ayiyo a putara ihe nwanne unya bu uka site na onu onye ukochukwu na elekota ulo uka Mount Olive Discipleship House dina mpaghara One Day nke Agbani Road na isi obodo Enugu bu Apostle Oliver Chukwu na okwu Chukwu ogwara ndi otu Christ na ofufe nso were onodu na ulo uka ahu.

Apostle Chukwu gbadoro ukwu na etu Andrew nakwa Nathaniel siri choo iru Jesu Kristi na akwukwo nso were kpokuo ndi otu Christ ka ha gbasoro ezi usoro na inabata Chukwu na ndu ha.

Onye ozi Chukwu a kowara na mmadu agaghi enwenata mmuo nke Chukwu na ndu ya beluso ma onye ahu ochotara ma nabatakwa Dinwenu Jesu Kristi na ime onwe ya.

Okpekwara ekpere maka ezi onodu gaara ndi otu Christ, Enugu State, ala Igbo, Nigeria nakwa uwa niile.

Onye nta akuko anyi bu Obiajulum Odogwu wetara ozi na obu na akwukwo nso John, isi nke mbu, amaokwu nke iri ano ruo na iri ano na otu ka Apostle Oliver Chukwu siri weta okwu Chukwu a ogwara ndi otu Christ na yabu ofufe nso.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited