Aka akparala otu nwoke na Ebonyi State maka iji okpokoro isi mmadụ were n’akpaghari.

Written by on March 6, 2025

Ndị uwe ojii na Ebonyi State anwụchiela otu nwoke bụ Ovuta Chigozie maka iji okpokoro isi mmadụ abụọ yana egbe atọ a rụrụ n’ala anyị were na akpaghari.
Nwoke ahụ ana enyo enyo ka e kwuru na o sitere n’ime obodo Okoffia nke dina council ime obodo Ezza South na Ebonyi State.

Na mgbe ana agba ya ajụjụ ọnụ ka Chigozie kwuru na e nyere ya okpokoro isi mmadụ ahụ iji were gwọrọ onye ahụ ọgwụ ọtụmokpo. Ndị uwe ojii mere ka amata na ha amalitela ịchọ onye nke ahụ ya bụ nwa amadi eji eji kpọrọ aha ya.

Nkea sitere n’akwụkwọ ozi SP Jọshụa Ukandu bụ ọnụ na e kwuru ndị uwe ojii na state ahụ nyefere ndị nta akụkọ taa bụ Wednesday na Abakaliki bụ isi obodo Ebonyi State.

Nwoke ahụ ka ndị uwe ojii kwuru na ha ga akpụpu n’ụlọ ikpe mgbe ha chịkọbachara nnyocha ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited