Opekatampe ụmụ afọ ala ndị isi ojii ruru mmadụ iri isii na asatọ na-eme njem n’ụzọ mkpuke akpọrọ migrants abụrụla ndị e gburu na ogbunigwe nke mba United States tụrụ n’obodo Yemen.

Written by on April 28, 2025

Ihe ruru mmadụ iri isii na asatọ na-eme njem mibanye na mba akpọrọ migrants bucha ụmụ afọ ala ndị isi ojii abụrụla ndị nwụnyuru anya piii n’oge mba United States nọrọ na ikuku zoo ka mmiri n’otu mpaghara nke otu isi ekwe ọnwụ akpọrọ Houthis jiri mere isi ọnọdụ na mgbago ugwu ndịda anyanwụ mba Yemen dịka otu igwe onyonyo Television na mba ahụ siri kọwaa.

Ya bụ ụlọrụ Al Masirah Kwuru na ndị ọzọ dị mmadụ iri anọ na asaa bụkwa ndị ahụ akpọrọ migrants merụrụ nnukwu ahụ n’oge atụrụ ogbunigwe na mpaghara Saada province nke mba ahụ. A hụkwara ihe onyonyo Videos ebe ebucha ozu ndị mmadụ si n’ụlọ ahụ nke ogbunigwe megoro ka ọ ghọọ ntụ na apụta.

Ka osiladi, o nwebeghi okwu ọbụla nke ụsụụ ndị agha mba United States kwuru banyere ebubo ndị a.

Mana nkea na-abịa ka o mechara awa ole na ole ụlọrụ Central Command nke mba United States kwụchara na ha akusuola ogige ebe ruru narị asatọ kemgbe ọchịchị Donald Trump nyechara iwu aka ọkụ ka ha wakpo ebe ndị ahụ otu isi ekwe ọnwụ bụ Houthis jiri mere isi ọnọdụ ha na mba Yemen n’abalị iri na ise nke ọnwa March n’afọ a.

Otu Houthis n’onwe ha nọrọ n’abalị ụnyaahụ bụ ụka were kwuo sị n’ogige ahụ ndị agha mba United States kusuru bụ ebe ejibu ụmụ afọ ala ndị isi ojii dị otu narị na iri na ise bụ ndị na-eme njem n’ụzọ iwu na akwadoghi.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited