Onye isi oche nke Oke-Ero LGA na Kwara State emela ka amata na ndị otu ha atọrọ n’ụbọchi Friday gara aga enwerula onwe ha.
Written by Onyinye on April 29, 2025
Mmadụ abụọ ọnụ n’eru n’okwu bu ndi otu Management nke Oke-Ero Local Government Area Council na Kwara State bu Alhaji Musibau Amuda, Director of Personnel Management nakwa Odoziaku Omoladun Arinde, Legal Officer bu ndi atọrọ n’ụbọchi Friday gara aga n’oge ha na eme njem site na lloffa bu isi ụlọ ọrụ ọchịchị ime obodo ahụ aga llorin bu isi obodo State ahụ, aburula ndị nwere onwe ha.
N’ozi sitere n’aka ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na State ahụ bu SP Adetoun Ejire Adeyemi n’ụbọchi Saturday mere ka amata na ndị oji egbe aga kwuchiri okporouzo na akụkụ Eleyin village nke Isanlu-Isin dị na Isin LGA na State ahụ, bu ebe ha nọrọ kwụsị ụgbọala Honda nakwa Toyota ma tọrọ mmadụ asaa nọ n’ime ụgbọala ahu.
Nkea putara ihe taata bu Monday nye ndị nta akụkọ site n’aka onye isi oche ọchịchị ime obodo ahụ bu James Fadipe, dika o mere ka amata na ha natara n’enweghị ihe mere ahụ ọbula.
Onye isi oche nke Oke-Ero LGA, emeghị ka amata etu mmadụ abụọ ahụ siri nweta nwere onwe ha n’ozi o weputara taata bu Monday mana okenere aka na chi State ahụ bu Governor Abdulrahman Abdulrazak, ndị leadership of the Association of Local Government of Nigeria, ndị ọrụ nchekwa, ndị eze ọdinani nakwa ndị ndu nke okpụkpere obula n’ebe ọdị ukwu maka mbọ ha gbara iji hụ na ndi ọrụ ya nwetara nwere onwe ha.
Ọ rịọrọ ka Chukwu Okike Abiama ga n’iru wee gozie ha, dika o mere ka amata na ha dị njikere itinye uchu n’ọrụ iji weta udo, agamniru nakwa mmepe na ọchịchị ime obodo, ebe ọ gara n’iru riọ Chukwu Okike Abiama ga onye ha udo, ịdị n’otu nakwa agamniru iji wee nwe ike chia ezi ọchịchị.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.