Aka ndị uweojii akpatala otu onye ukochukwu kwere maka na ọwakporo nwatakịrị nwanyị dị afọ iri na Rivers State.
Written by Onyinye on May 30, 2025
Aka ndị uweojii na Rivers State akpatala otu onye ukochukwu enyedebere aha ya dika Lucky kwere maka na ọ wakporo otu nwatakịrị nwanyị dị afọ iri na Ihuaje community dị na Ahoada East LGA na State ahụ.
Nwuchi nwa amadi a bu nke sitere n’aka otu ndị nchekwa ime obodo amakariri dịka ONELGA Security Planning and Advisory Committee nke enyere akara ejiri mara otu ahụ dika OSPAC.
Ozi kọwara na onye isi nke OSPAC na Ahoada East Council bu Precious Ihuruzu kpọrọ ndị otu ya gaa na obodo ahụ ngwa ngwa ha nwetara ozi gbasara mwakpo ahụ, ha nwuchiri onye ukochukwu ahụ ma nyefee ya n’aka ndị uweojii nke Ahoada Police Division.
Otu nwoke so n’ime otu ndị na ebu agha emegide mmetọ arụ ụmụaka nakwa mmekpa ahụ bu Dennis Otobo kọwara na onwetara ozi site n’aka ụlọ ọrụ n’ahụ maka ahụ ike na state ahụ gbasara otu nwatakịrị nwanyị ahụ a na awakpo n’ike.
Ọ gara n’iru mee ka amata na nyocha ya tugara ya aka n’ebe onye ukochukwu ahụ nọọ bu onye na elekọta otu ụlọ akwụkwọ kwụrụ n’onwe ya na Ihuaja community dị na Ahoada East bu ebe ọ chọpụtara na ọ na emetọ nwatakịrị nwanyị ahụ dị afọ iri bu onye so n’ime ụmụaka ọ na elekọta.
O mere ka amata na oge Nne na Nna nwatakịrị ahụ biara ịhụ ya na nwatakịrị ahụ gwara ha ihe ọ na agabiga n’aka onye ukochukwu ahụ, dika ọ kọwara na mgbe ọbula ometọrọ ya na ọ na enye ya narị naira ise yabu ₦500 ka oghara ịgwa mmadụ ihe onye ukochukwu ahụ na eme ya.
Nne na Nna nwatakịrị nwanyị ahụ kpọ ya ga n’ụlọ ọgwụ maka nyocha bu ebe achọpụtara na onye ukochukwu ahụ na ama ya elu n’ike, dika ha gara n’iru kpọturu ndị uweojii, ka ọdị ugbua onye ukochukwu ahụ nọzi n’aka ndị uweojii na Ahoada Police Station.
Otobo nyere DPO nke Ahoada Police Division, onye isi ndị nchekwa na Ahoada East LGA bu Hector Ekeakita, onye isi OSPAC bu Prince Wiro ma burukwa onye National Coordinator of Centre for Basic Rights and Accountability Campaign iwu ka ha gba mbọ hụ na onye ukochukwu ahụ nwetara ntaramahụhụ ruru ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.