Ndị uweojii na Kano State mere ka amata na ha anwuchiela mmadụ iri na ise ana enyo enyo n’oge ha na eme mkpocha na nzacha.
Written by Onyinye on June 18, 2025
Ndị uweojii na Kano State mere ka amata na ha anwuchiela mmadụ iri na ise ana enyo enyo ma nweta ọtụtụ ngwa ọgu ya nakwa ọgwụ ike n’oge ha na eme mkpocha na nzacha bu nke gbadoro ukwu n’ikpochapu ebe ndị omekome ji mere isi ọnọdụ na mpaghara dị iche iche na State ahụ.
Yabu ọrụ mkpocha na nzacha bu nke ha mere mkpụrụ ụbọchị atọ dika ọ malitere n’ụbọchi Friday ruọ n’ụbọchị Sunday, ebe ndị uweojii ahụ rụgasiri ọrụ ha na Kano gụnyere, Dala, Gwale nakwa Tarauni LGA, ndị ọzọ gụnyere Kofar Mata, Zaga, Kurna, Rijiyar Lemo, Dorayi, Hotoro nakwa Sheka Quarters.
Osote onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii bu DSP Hussaini Abdullahi mere ka nkea puta ihe ụnya bu Monday, dika ọ kọwara na mkpocha na nzacha ahụ bu mbọ ndị uweojii na agba iji chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala na State ahụ.
Abdullahi gara n’iru mee ka amata na Commissioner ndị uweojii bu Ibrahim Bakori, dọrọ ohaneze aka na ntị ka ha ghara ina iji ngwa ọgu n’oge ha na eme mmemme ọdinani dika Kidan Gangi.
Ọ gara n’iru kọwaa na etu ha siri egosipụta ngwa ọgu n’ụwa ozi dị iche iche bu nke na adịghị mma, ma buru nke nwere ike dọrọ ụmụ na eto-eto banye na otu nzuzo ma ọbu ihe yiri ya.
Bakori gakwara n’iru mee ka amata na aga anwụchi onye ọbula ahutara ngwa ọgu n’aka ya ma nye ya ntaramahụhụ ruru ya, n’otu aka ahụ, ọ dọrọ ndị Nne na Nna, ndị na elekọta ụmụaka nakwa ndị na akpụzụ aka na ntị bu ndi na akwado ụmụaka ha iji ngwa ọgu ka ha sepu aka enwe n’ofe tupu ọghọrọ aka mmadụ, dika ọnwụrụ iyi na aga ejide ha ma nyekwa ha ntaramahụhụ n’ụzọ iwu.
Bakori rịọrọ ohaneze ka ha kee nkwucha ma gbaa mbọ kpọturu ndị uweojii na akara ekwentị gbata-gbata ha bu 080-32-60-02-99, ma ọbu 080-32-60-03-00, ma ọbukwanụ 080-32-60-03-01, mgbe ọbula ha hụtara ihe dị agha na gburugburu ha, dika ọ kwere nkwa na ha ga ekpochapu ndị omekome ma weta udo nakwa nchekwa zuru oke na State ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.