Senator Orji Uzor Kalu emela ka amata na ebumnuche ya ịbụ onye isi ala ga echeregidi gaghe mgbe President Tinubu chizuru ọchịchị ugboro abụọ ya.
Written by Onyinye on June 20, 2025
Nwa amadi ahụ na anọchite anya Abia North ma burukwa onye isi oche Senate Committee on Privatisation bu Senator Orji Uzor Kalu, emela ka amata na ebumnuche ya ịbụ onye isi ala bu nke ga echeregidi ganye mgbe onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu chizuru ọchịchị nke ugboro abuo ya.
N’oge ọ na agwa ndị nta akụkọ okwu n’ụbọchi Tuesday na Igbere, Bende LGA na State ahụ, Kalu kwụsịrị ike na ịrụbe isi n’otu ndọrọndọrọ ahụ bu ihe kacha mkpa karịa mmasi nke onwe.
O kwuru na otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress APC, eweputala President Tinubu dịka onye ga
aputa ọzọ, kwere maka nke ahụ na ebumnuche onwe ya ga adabariri na mkpebi nke otu ndọrọndọrọ ahụ.
Senator Kalu kwuru na ọburu na ya ka nwere mmasị nakwa ikike ịbụ onye isi ala, na ya nwere ike eweghachi mmasi ya ma President Tinubu chisia.
Na nlegara anya na ntule aka ọchịchị ga ewere ọnọdụ na afọ 2027, Senator Kalu bu onye jibu ọkwa Governor na State ahụ, kwupụtara mmasi ya ịga nke ugboro abuo na Senate ma ọburu na ndi ọ na anọchite anya ha ga akwado ya.
Kalu gara n’iru too mbọ President Tinubu gbagoro n’ọchịchị ya, ma kwupụta obi isi ike onwere na onye isi ala anyi ga ewepụta ezi ọnọdụ ka mma nyere akụ n’ụba ala anyi bu Nigeria.
N’okwu ya gbasara ndị nkatọ na ajụ ajụjụ banyere oge nkwado President Tinubu, Kalu gbachiteere atụmatụ ahụ, ma kọwaa ya dịka atụmatụ mkpebi siri ike iji kpalie onye isi ala anyi n’imeputakwu ihe.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.