Ụlọrụ NNPCL ebudatala ọnụ ahịa ana ere otu ntụ lita fuel n’ala anyị.
Written by Onyinye on July 7, 2025
Ụlọrụ n’ahụ maka mmanụ ụgbọala n’ala anyị bụ Nigerian National Petroleum Company Limited ewedatala ọnụ ahịa ana ere mmanụ ụgbọala amara dịka premium motor spirit PMS.
Ndị nta hutara na ụlọrụ ahụ nọrọ ụfọdụ ebe na Abuja ụnyaahụ bụ Satọdee malite ire otu ntụ lita narị itoolu na naira iri ya bụ ₦910 n’ime ₦945 ha na erebu ya.
Otu ọnụ ahịa ahụ ka ahụkwara ka ha na ere ya n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ gụnyere mpaghara zone 6, Kubwa Expressway, Wuse Zone 4 yana ọtụtụ ebe ndị ọzọ.
Nkea ka ahụtara ka o mechara naanị ihe ruru abalị anọ ogbo ha nke Dangote Refinery siri na ₦880 budata nke ha ka ọ bụrụ ₦840 kwa otu ntụ lita fuel.
Ebe ọtụtụ ebe ka akana ere ihe karịrị narị naira itoolu na Lagos State.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.