Ulo akwukwo mahadum Abia state akatola ebubo akwughi ugwo onwa nyere ndi nkuzi ana ebo ndi nchikwa mahadum ahu.
Written by Onyinye on July 18, 2025
Ulo akwukwo mahadum Abia state University ABSU dina ututu emela ka amata na onweghikwa onye nkuzi mahadum ahu nke ha ji ugwo ,ma n’ akowa na ndi nke n’ ekwu na eji ha ugwo onwa iri na abuo bu ndi achuru kemgbe ihe ruru otu afo k’ odi ugbua kwere maka na ha enwetabeghi olu na mahadum ahu n’ uzo kwesiri ekwesi.
Iga echeta na otu ndi nkuzi ewere olu na afo 2023 noro n’ oge ha n’ agwa ndi nta akuko okwu ubochi Saturday gara aga n’ Umuahia, kwa ariri si na agbanyeghi na ha enwetabeghi akwukwo ederede ejiri chuo ha n’ olu, na ulo akwukwo mahadum ABSU kwusiri ikwu ha ugwo kemgbe onwa June afor 2024.
Habu otu yoziri governor Alex Otti ka omere ha ebere ma were ha dika umu ya site n’ ilebara anya n’ ihe ndi ahu n’ akpa ha.
Na nke ha ka ulo akwukwo mahadum Abia state noro n’ ozi onyefere ndi nta akuko nke obu onye registrar ulo akwukwo ahu bu Acho Elendu binyere ya aka me ka amata,na ndi nkuzi ha nile n’ eri ugwo onwa ha etu okwusiri kemgbe abali iri abuo na itolu nke onwa May afo 2023 Governor Alex Otti banyere n’ ochichi.
Nwa amadi mere ka amata na ebubo ahu ana ebo bu iji katoo ndi nchikwa mahadum ahu nakwa government Abia state.
Omekwara ka amata na usoro iwe n’ olu govt state ahu nyere nkwado ya bu nke n’ aga n’ iru ugbua nyere onye obula tozuru oke tinyekwara ndi nke achuru achu ohere ideta akwukwo ana m acho olu .
K’ osiladi habu ndi nchikwa mahadum yoziri ohaneze ka ha gharakwa iji ebubo ugha ahu n’ agaghari kporo nkpa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.