Ndi Ekperima Etisala Ogige Ume Oku Ala anyi Dina Delta State

Written by on March 20, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi ekperima awakpola ma bie aka ojo ntisa na ogige ume oku electric nke T99 dina owara oku Ugbelli/Benin 330 KV Transmission Line na Delta State.

Nke a putara ihe taata bu Friday site na onu onye General Manager na ahu maka odimma ohaneze nyere ulo olu ikikere oku Transmission Company of Nigeria TCN bu Odoziaku Ndidi Mbah na ozi onyefere ndi nta akuko na Abuja.

Odoziaku Mbah gwara ndi nta akuko na obu oge njem nleta Line Patrol ulo olu TCN mere na imime obodo Coconut Village dina Effurun bu isi obodo Uvwie LGA nke mpaghara Warri na Delta State ka achoputara ntisa yabu ogige owara ume oku.

Okowara na obu aka ojo ndi ekperima kpara na igwe osisi tower yabu owara oku butere ya odida, ebe ndi ahu ihe oma na asa afo gara na iru tisa ma zuo ori otutu akuru ngwa na ya.

Yabu onye General Manager ngalaba Public Affairs nyere ulo olu TCN koro ndi nta akuko na ndi ntisa ahu gara na iru kpa aka ojo na osisi igwe owara oku nke T100 nakwa T101 ma zuo ori na ha.

Ka osiladi, habu T100 nakwa T101 ka nwaanyi a kowara na ha adabeghi na ala etu nke T99 siri daa.

Okowara na onodu a ebutego ihe mkpobi ukwu nke nkesa oku electric site na ume oku National Grid gaara ndi na amu oku na mpaghara Benin 330 KV Transmission Line.

Okwuputaziri na ulo olu ya bu TCN amalitego ichikonata ihe na usoro ha iga bido olu ndozighari nakwa mweghachite oku na habu ebe ndi a ndi ekperima biri aka ojo.

Odoziaku Ndidi Mbah kpokuziri ohaneze ndi nwere agba na ala anyi a ka ha sonyere na ibu agha megide ntisa akuru ngwa oku nakwa akuru ngwa ohaneze ndi ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited