Gov Francis Nwifuru Na-achị Ebonyi State Ekwuputala Udi Ndi Ga Eji Okoloto Otu Ndorondoro APC Zoo Okwa Na Ntule Aka Ochichi Afo 2027 Na State Ahụ
Written by admin on April 9, 2026
by Chika Nwazu
Aka na-achị Ebonyi State bụ Gov Francis Ogbonna Nwifuru ekwuola ya hoo haa na ọbụ naanị ndị rugoro ihe ndị ahụrụ anya nọkwa enyere ha ma ọbụ nọkwa ndị ha jigoro n’oge gara aga na state ahụ ka aga enye ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress APC ka ha jiri zọo ọkwa ọbụla na ntụli aka ọchịchị izugbe afọ 2027.
Gov Nwifuru kwuru nkea n’oge osonyere onye Deputy Chief Whip nke ụlọ nzukọ ukwu senate bụ Sen Onyekachi Nwebonyi igbape ụfọdụ ọrụ ngo nwa amadi ahụ rugoro na mpaghara Ebonyi North Senatorial District bụ mmemme were ọnọdụ na ubochi Wednesday.
Onye aka na-achị state ahụ nke onye nọchiri anya ya bụ onyeisi oche otu ndorondoro APC na Ẹbọnyi bụ Stanley Okoro Emegha gwara ndị ahụ na enweghị nke ha rụrụ ka ha ghara ịnye onwe ha nsogbu kworo maka na onweghị onye ga atụpuru ha ọnụ tinyere na ihe ndị ahụ mere n’afọ 2023 agaghị emezi ọzọ.
N’okwu ya ka Sen Nwebonyi kwuru na ọbụ nzọụkwụ nke Gov Nwifuru gbara ya ume ibagide ọrụ ngo ndị ahụ nyere ụmụ afọ Ebonyi State tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ okwuru na ya ka aga arụ ma ọbụrụ na ha ahọpụta ya ọzọ n’afọ 2027.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.