Umunwaanyi Izzi Ayiola Gov Nwifuru Nke Ebonyi State Ka Oputa Zoo Ochichi Nke Ugboro Abuo Ya

Written by on April 10, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ogbako jikoro umunwaanyi Izzi nke Ebonyi State enwela nkwekorita na otu olu sina obu aka na achi State ahu bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru ka hana akwado iga ochichi nke ugboro abuo ya dika Governor Ebonyi State na afo 2027.

Nke a putara ihe unya bu Thursday na Abakaliki bu isi obodo State ahu oge habu umunwaanyi nona ogbako akporo Izzi Women General Assembly mere njem ngaghari nkwado na mpaghara di ichiche nke isi obodo State ahu nyere yabu aka na achi State.

Ka ha mechara njem ngaghari nkwado a ka habu umunwaanyi wuchiri na ogige isi ulo olu otu jikoro okpuru ochichi ime obodo enwegasiri na ala anyi akporo Association of Local Govt of Nigeria ALGON ngalaba ya nke State ahu dina Abakaliki buzi ebe ha noro nyefe asambodo nkwado ha kporo certificate of endorsement gaara yabu aka na achi State.

Na okwu ha na oge nnyefe asambodo a ka ufodu na ime umunwaanyi welitere isi na Izzi nke gunyere: Hon Chinyere Nwogbaga na anochite ogbonta vote Ebonyi North East State Constituency na ulo nzuko omebe iwu State ahu, Odoziaku Jessica Chinedu-Uburu bu nwunye onye isi oche Ebonyi LGA nakwa ufodu ndi ozo kowara ezi ochichi Gov Francis Nwifuru dika ihe kpatara nkwado ha ka obiaghachi ochichi nke ugboro abuo.

Ha mere ka amata na ngalaba ndi ahu Gov Nwifuru kachasi eme nke oma gunyere: aruike, mmuta, nkwalite ndi mmadu, olu ngo okporo uzo na ihe ndi ozo eji enyere obibi ndu aka, nchekwa, olu ugbo, nakwa otutu ngalaba ndi ozo.

Na nzaghachi ya oge ona anata yabu asambodo na aha aka na achi State ahu ka onye Principal Secretary nyere yabu Gov Nwifuru bu Chief Mathias Adum kenere ha ma kwe nkwa sina ochichi State ahu ga aga na iru inye ohaneze ndi Ebonyi ezi elele ochichi onye kwuo uche ya.

Onye nta akuko anyi wetara ozi na habu umunwaanyi sitere okpuru ochichi ime obodo ato mejuputara ala Izzi na State ahu bukwanu ndi gunyere: Izzi LGA, Ebonyi nakwa Abakaliki LGAs.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited