Ulo Ikpe Enyela Ikikere Inara El-Rufai Na Akaebe

Written by on April 14, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo ikpe ukwu Federal High Court dina Kaduna State enyela ikikere ina na akaibe gaara onye ahu jitopuru okwa Governor Kaduna State bu Malam Nasir El-Rufai na njichi ahu ulo olu ala anyi na ebu agha emegide mpu na aru bu Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission ICPC jichiri ya kemgbe.

Nke a putara ihe taata bu Tuesday na nkabi ikpe yabu ulo ikpe nyere akwukwo inara na akaebe akporo Bail Application El-Rufai jiri yoo ka anara ya na akaebe site na ulo ikpe ICPC na akpughari ya kemgbe.

Ka osiladi, ulo ikpe ahu mere ka amata na yabu onye jibukwara okwa Minister ala anyi huru maka FCT Abuja na oge ochichi Chief Olusegun Obasanjo gaa aga na iru noro na ulo nga ICPC were ruo mgbe omezuru ihe niile dina akaebe a anara ya.

Ndi nta akuko nwetara ozi na obu onye welitere isi na otu ndorondoro African Democratic Congress ADC ma burukwa nwa nwoke yabu El-Rufai bu mazi Bello El-Rufai mere ka ozi inana akaebe a puta ihe ngwangwa yabu ulo ikpe kabichara ikpe ya na ehihe taata.

Ozi gakwara na iru kowa na nke a na abia na agbanyeghi na ulo ikpe ukwu nke Kaduna State High Court kana aga na iru na ikpe ya megide yabu Malam Nasir El-Rufai na akwukwo ikpe ICPC noro na odi nso a kpatugharia aka megide yabu onye jitopuru okwa Governor State ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited