Ndi Uwe Ojii Ekwuputala Ofufu Na Ike Otu Nwagboghobia Sitere Ebonyi State Furu Na Enugu State

Written by on April 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State ekwuputala maka ofufu nakwa ochicho ana acho otu nwagbobia gbara afo iri abuo enyere aha ya dika Anna Nwigbo na State a.

Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State a bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na nwagbobia a na efu efu bu nwa afo Ezza Alioma autonomous community dina Ohaukwu LGA nke Ebonyi State, ebe amalitere icho ya acho kemgbe abali iri abuo na asaa nke onwa March gara aga orapuru ebe obibi ha dina No 40 Valley Crescent na mpaghara Independence Layout nke isi obodo Enugu gawa ebe ana amaghi.

SP Ndukwe gwara ngalaba akuko uwa anyi na obu onye yana nwagbobia a bi bu Ikenna Larry Ifemelunwa wetara habu ndi uwe ojii mkpesa maka ofufu nakwa ochicho ana acho ya, ebe mbo niile agbagoro ichoputa ebe ono kuchara afo na ala.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na State a mere ka amata na nwagbobia a na efu efu nwere akpukpo aru di ocha, ebe ona enweghi akara agburu na iru dika asusu Igbo nakwa bekee na aga ya werewere na onu.

Na ikpeazu ka yabu onu na ekwuru ndi uwe ojii na Enugu State yoro ohaneze onye hutara ma obu nwe ozi ga enye aka ichoputa ebe nwagbobia a no ka onye di etu ahu kpoturu isi ulo olu ndi uwe ojii kachasi di ya nso.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited