Yul Edochie Enyela Nkowa Sina Peter Obi Agaghi Abu Onye Isi Ala Abodo A Bu Nigeria

Written by on April 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Nwa afo Anambra State ama ama na imeputa ihe nkiri onyonyo film na ngalaba ejije Nollywood ala anyi bu Yul Edochie ekwuola ya hoo-ha sina onye ahu ji okoloto otu ndorondoro Labour Party zoo okwa onye isi ala anyi na afo 2023 bu mazi Peter Obi agaghi abu onye isi ala Nigeria na oge di ugbu a.

Yul Edochie bu nwa nwoke Pete Edochie mere ka nke a puta ihe taata bu Tuesday na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze ya.

Yabu nwa amadi megoro otutu ihe nkiri onyonyo film kowara na Peter Obi nke jiburu okwa Governor Anambra State enweghi ume okwe ndorondoro na udi okporo Political Strength izotanwu ma buru onye isi ala Nigeria na oge di ugbu a.

Okowara nsonyere Peter Obi gara sonyere na otu ndorondoro African Democratic Congress ADC dika igbu oge ya ma buru atumatu kugoro afo na ala.

Yul Edochie mechara bo ebubo sina otu ndorondoro obuna mazi Peter Obi sonyere ga aghasariri.

Ndi nta akuko nwetara ozi na Yul Edochie bu onye nkwado gaara ochichi President Bola Ahmed Tinubu, ebe onoro na afo 2017 jiri okoloto otu ndorondoro Democratic People’s Congress zoo okwa Governor Anambra State ma buru nke odara maa afo na ala nke ojo ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited