Otu Ndorondoro APC Na Ebonyi State Enyela Ntuzi Aka Ihe Onye Choro Iji Okoloto Ya Zoo Okwa Ochichi Ga Emeriri Tupu Onweta Okoloto Yabu APC

Written by on April 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu ndorondoro All Progressives Congress APC na Ebonyi State enyela ndumodu gaara ndi choro iji okoloto ya zoo okwa ochichi na State ahu ka ha buru uzo nata ikikere sitere na aka Gov Francis Ogbonna Nwifuru tupu ha aga igote akwukwo ikikere Nomination Forms.

Ndumodu a putara ihe unya bu Monday na Afikpo LGA site na onu onye isi oche yabu otu ndorondoro APC na State ahu bu Chief Stanley Okoro Emegha na ogbako ejiri guzobe otu nkwado gaara President Bola Ahmed Tinubu nakwa Gov Francis Nwifuru maka mpaghara Ebonyi South Senatorial District.

Chief Okoro Emegha doro aka na nti sina onye obuna gotere akwukwo ikikere Nomination Forms otu ndorondoro APC na State ahu maka izo iji okoloto ya zoo okwa ochichi na ebughi uzo nata nkwado Gov Nwifuru bu onye na egbu oge ya mana alakwa ego ya na iyi.

Okowaziri na onweghikwa ego obuna akwunyere otu ndorondoro APC aga akwughachi azu ma elegara anya na ndi ahu nwere mmasi iji okoloto otu ndorondoro ahụ zoo okwa ochichi.

Oyoro habu ndi nwere mmasi izo okwa ochichi ka ha gharakwa ikwe ka nkwanye oku na ike sitere na owa ozi mmekorita ọhaneze duhee ha uzo kama ka ha gbasoro usoro kwesiri ekwesi.

Yabu onye isi oche otu ndorondoro APC na Ebonyi State kowara na ogaghi atupu onu nyere mkpesa obuna sitere na aka ndi mefusiri ego ha na igote akwukwo ikikere izo okwa na ebughi uzo nata nkwado aka na achi State ahu bukwanu onye okowara na obu naani ntuzi aka ya ka APC ga agbasoro na yabu Ebonyi State.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited